Atọhapụla nwoke jere nga maka ikpọga agbataobi ya ụlọọgwụ

0
564
nga

Chris Anyichie

 

OTU nwoke nke a na-ebochị ọnụ ma tụkwa ya ñga maka ịgbu agbataobị ya ka ọkpọgachara ya n’ụlọ ọgwụ abụrụla onye nweere onwe ya ka afọ abụọ gasiri.

Nwoke a bụ Maazị Chidiebere Onwumere, bụ onye Umuagbaghagha n’okpuru ọchịchị Osisiọma nke Abia Steeti ka a kpọchiri ka ebochichara ya ọnụ na ọ bụ ya gburu agbata obi ya, bụ Uzochi Chinyere, bụ onye nke bikwa otu ebe ahụ nwoke a bi na ya.

Ka ọ na-akọwara ndị obodo Umuagbaghagha n’Osisioma Abia Steetị, ihe mere mgbe akpọpụtachara ya n’ụlọ nga nke dị n’Afara, Umuahia, n’ubochị Tuzdee, Maazi Chidiebere, bụ onye abụ otuto juputara n’ọnụ nokwa na-ekele Chineke maka ịnapụta ya n’ahụhụ ọtara afọ abụọ n’ihi ịhe ọ maghị ihe gbasara ya. O kwuru na ọ bụ ebe ọchọrọ ka ọ zọpụta agbataobi ya ka o ji wee nata ntaramaahụhụ a.

Maazi Chidiebere kwuru okwu si, “aloghachirim ebe m bi n’Umujiji Isiala Osisioma n’ ebe elekele nke isii na mgbede ka izu ụka abụọ gara aga n’obodo m ebe m gara ịgbukota nakwa ime mkpụrụ akwụ ka m hụrụ agbataobi m ka o dina ala, m nyere ya aka, kpọga ya ụlọọgwụ, tinyekwara ndị agbataobi ndị ọzọ nyere aka n’ihi na onweghi ndi be ya nọ nso”.

“Otu onye ozi nke Chineke nke bi na okirikiri ebe ahụ wee nyere aka buru anyi n’ugbọala ya gawa ụlọọgwụ di nso nke akpọrọ ụlọọgwụ Shiloh,ka dọkịnta lelechara ya ahụ, o wee si anyi kwunye puku ise ka ọwee mee nyocha  nke ga-egosịpụta ịhe bụ nsogbu ya,ndị agbataobi tukọtara ego ahụ wee kwunye,ngosi nke laabu putara, dokịnta wee gwa anyị si na onwere ihe ọṅụrụ nke kariri na ahụ ya wee wetara ya ahụ ọnwụnwụ a,mana onyere anyị okwu ya, n’ọga enye ya ọgwụ kwesiri na ọga adikwa mma ọzọ”.

“N’ụtụtu echi ya, Maazi Promise bụ nwanne ya nwoke nke okenye bịara n’ụlọọgwụ wee kwechịrị na ọ ga-akpọrọ nwanne ya nwaanyi. Ọ kpọrọ ya wee gaa ebe mmadụ amaghị.”

“Ka mkpụrụ ụbọchị ole gasịrị, Promise nachitere n’ụlọ anyị wee kpọrọm gaa World Bank Police Station, Aba, ebe ọ kpọrọm nyefee na–aka ndị uwe ojii wee na ekwu na m tigidere nwanne ya ihe, o wee nwụọ.”

“N’agbanyeghị biko nile agbataobi na ario ya nakwa ụmụnne ya ndị ọzọ na akam dị ocha,ọ baghi ya nti. A gwakwara ya na nwanne ha nwaanyị nwụrụ n’ihi ihe ọṅụrụ, Promise kwechiri wee dee akwụkwọ megịdem na ọ bụ m gburu mmadụ, e wee kpọchiem na ‘suit’ “na U/520c/2016”.M wee nọgide n’ụlọ mkpọrọ site n’ọnwa Juunu,afọ puku abụọ na iri isii, wee rue taa. Ọ bụrụ na ọbụghị maka onye ọkaịkpe Jerry Uzosike, onye Chineke jiri kwara ngwaọrụ, okwuchiterem ọnụ m ma kpọpụtakwam n’ụlọ mkpọrọ taa.”

Ọka ịkpe Uzosike kwudosikwara ike na-ekwu na a ga-achọ usoro a ga e ji dozie ajọ ọnọdụ a ma weputakwa ụzọ kwesiri a ga e ji kwụghachi ndi udị ịhe a dakporo.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here