Bishọọpụ Ezeokafor agozie ngwaọlụ ‘Visitation Hospital’ Umuchu

0
600

Chinwendu Uzoatu

 

Ọ BỤ nnukwu ihe ọñụ n’ụlọọgwụ ndị ụka bụ ‘Visitation Hospital’ dị n’Umuchu, n’okpuro ọchịchị Aguata na steeti Anambra dịka Bịshọọpụ ụka Katọlik Dayọsis Awka bụ ‘Most Rev. Dr Paulinus Chukwuemeka Ezeokafor wụchara na ya, nke bụ njem mbụ ya n’ọlụ ozioma n’ụlọọgwụ ahụ.

E ji aja maasị dị asọ wee malite mmemme a. Bishọpụ kelere ndị isi na ndị ọlụ nọ n’ụlọọgwụ ahụ, gozie ma gbapee ọtụtụ ihe n’ụlọọgwụ ahụ ndị gunyere mmiri ọñụñụ ‘borehole’, igwe na-enye ọkụ nke ọgbara ọhụrụ, nke ya bụ bishọọpụ nyere aka wee zụta.

Ọ gakwara n’ihu gozie ụlọ ebe a na-edebe ọgwụ tinyekwara ụlọ ebe a na-agba ọgwụ mgbochi na ebe obibi ndị ọlụ. O letara ma kpekwaara ndi ọrịa ekpere ma nọrọkwa n’elu ya kwụọrọ otu nwoke aha ya bụ ThankGod ụgwọ ụlọọgwụ.

Ọ gozikwara ụlọ ekpere ‘Chapel of Divine Mercy’ bụ ebe ndị ọrịa na mmadụ nile ga na-ekpe ekpere.

Onye nlekọta (manager) ụlọọgwụ ahụ bụ ‘Rev Fr’ Barnabas Okafor kelere Bishọọpụ Ezeokafor maka ihunanya ya dịka ọ gara n’ihu kelee mmadụ nile. O gosikwara afọ ọma o nwere n’ebe ndị ọchịchị steeti Anambra nọ, tinyere ọchịchị Peter Obi na ọchịchị ugbua nke Willie Obiano nọ n’isi ya maka mbọ na nkwado ha n’ebe ụlọọgwụ ha nọ.

Ochefughi kọmishọna na-ahụ maka ahụike bụ ‘Dr’ Joe Akabuike maka ọlụ ọma ya

N’okwu nke ya, ‘Rev. Sr’ Gilbert Ekwommadu, bụ onye ‘matron’ ụlọọgwụ ahụ na ndị ọlụ niile, kelere Chineke maka ya bụ mmemme.

E ji egwu na amụ, oriri na nkwari, tinyekwara egwu egedege, nke ndị ‘CYON’, ‘Holy Name Parish,’ Umuchu, gbara wee weta emume a na njedebe.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here