Buhari ziga ndị agha ka ha ga kọba ugbo – Ohaneze

0
543
Ohaneze

Chinwendu Uzoatu

 

OHANEZE Ndigbo akpọkuola Gọọmentị Etiti ka ha ziga ndị agha  ka ha ga kọba ugbo ya na ebe a na-alụ ụzọ dị iche iche; tinyekwara iji ha chọọ obodo mma ma ọ bụrụ na o nwezighi ọlụ nchekwa nke ha ga-alụ karịa  I ji ha eyi ndị mmadụ egwu.

Onye okwupụta okwu Ohaneze, Chuks Ibegbu, bụ onye kwuru nke a maka atụmatụ egwu eke ‘Operation Python Dance 3’ na ‘South-East, kọwara na ọ gbagwojuru ya anya ihe kpatara nke a ebe ọ bụ na mpaghara ahụ nọ n’udo. O dọrọ aka na ntị banyere I ji usoro ọbụna na-eyi ndị mmadụ nọọrọ onwe ha egwu.

O kwuru sị “Ndị agha ala Nigeria kwesịrị ịnọ ugbua na-emepụta ngwa agha bụ nke Nigeria na-etinye nnukwu ego nke e kwesiri iji mepee obodo a karịa ma imepụta sọọsọọ nnu na ngwa agha ndị dị mfe na ‘DICON’ ma were oge ndị ọzọ na-eyi ụmụ Nigeria na-achọghị nsogbu egwu.

“Anyị chọrọ ndị agha na ndị nchekwa nke ndị mmadụ chọrọ, ọ bụghị ndị na-eyi egwu. Ka ndị agha gaa rụpụta ihe oriri maka ndị ọlụ ha n’ugbo ya na ndị agha ma resị ụmụ Nigeria ndị fọrọnu.”

Gbasara otu ili nke e liri ọtụtụ mmadụ ‘mass grave’, nke a chọpụtara n’Asa nke dị n’okpuru ọchịchị Ukwa ‘West’ na steeti Abia, Ibegbu kpọkuru otu ndị ọ dị n’aka ‘National Human Rights Commission, ECOWAS, AU, UN, ICC na ọtụtụ ndị ọzọ, ka ha lebaa okwu ahụ anya ma chọpụta ka mmiri si baa n’opi ụgbọgụrụ. Ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu, ka a chọpụta ndị kpara arụ ahụ na ndị bụ ndị e gburu egbu.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here