Nanka e riela ji ọhụrụ

0
1041
ji ọhụrụ

Chris Anyichie

 

IHE mmemme iri ji ọhụụ nke ndị Nanka n’okpuru ọchịchị Orumba ‘North’ nke Anambara Steeti ka e mere n’izu ụka gara aga n’Obi Igwe Godwin dị na Nanka.

Ihe mmemme a dotara ọtụtụ igwe ndị ọzọ, ndị na-akwado omenala,ndị ọlụ gọọmentị,ndị isi ụlọ ọlụ dị iche iche,ndị ụka,ndị echichi na otụtụ mmadụ.

Na mmemme a, lgwe Ezeilo kpọkuru ndị gọọmentị n’ogogo ọbụla ka ha na etinye uchu n’ọlụ ugbo ka e nwee ike hụ na nri dị na ala anyi.Igwe Ezeilo gwara ndị ntorobịa ka ha makụọ ọlụ ugbo ka ha wee nwee ike kwudo n’onwe ha. Ọ kenekwara Gọvanọ Willie Obiano maka mbọ nile ọ na-agba maka itụghari ọnọdụ ọlụ ugbo n’ebe ọ dị ukwuu.

Ọ kpọrọ ndi Igbo ka ha si na omume nwere ike ighasa omenaala ha pụọ, kọwaa na omenaala bụ etu ndị si ebi ndụ.

Na mbụ n’okwuchukwu n’ụka e ji malite mmemme a, ‘Rev Fr’.Christian Umeojilinnaka bụ ụkọchukwu n’elekota ụlọụka”Saint Anthony’s Catholic Church,’Nanka, kọwara mmemme iri ji ọhụụ dịka ohere ndị mmadụ ji e gosi chineke obi aṅụri maka nnukwu owuwe ihe ubi o nyere ha.

Na okwu ha di iche iche, onye isi oche Ohaneze Ndigbo na steeti Anambra bụ Chiifu Damian Okeke Ogene, Ọkammuta Emeka Okoli na Chiifu Osita Ezechukwu, chọpụtara na ndị Igbo bụ ndi hụrụ omenala na odinaala ha n’anya ma na-agbasi mbọ ike ichekwa omenala na ọdinala ha.

Na okwu ha, Chiifu Aniazoka Zokas, Ngozi Izuehie na Godwin Nwafor, kwuru na ndị Igbo ga-agaghachi azụ n’ọlụ ugbo,nke so n’ihe na-egosi ndi ha bụ.

GUO:  Otu Ogboada eriela ji ọhụrụ, mechie afọ n’añụrị

N’ihe mmemme a, ka a kuzikwara otu mmadụ ga-esi gbanahị ndọkasị ahụ na ihe nwere ike ịpụta na ndọkasi ahụ, nke Ọkammụta Bernice Ezeilo kuziri .

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here