Ndị gọvanọ akatọọla ọlụ gọọmentị etiti na ‘S’East’

0
584
Ndị gọvanọ

Chinwendu Uzoatu

 

NDỊ Gọvanọ ‘South East’ ala anyị ekwuola hoo haa na Gọọmentị Etiti amaala afọ n’ala n’imejupụta nkwa o kwere maka ọlụ ‘2017 budget’.

Ndị gọvanọ a kwuru na ha dị na mbụ nwee mmasị maka usoro ọlụ 2017 ahụ n’ihi na ọ gara n’usoro ọlụ na amụma nke ọchịchị ugbua site n’afọ 2017 ruo 2020. Mana e mesia n’ikpeazụ, otu abụghị n’ezi.

Ndị gọvanọ a kwuputara ebumnobi ha site n’aka onye ‘Director General of South East Governors Forum’ bụ Ọkammụta Simon Otunaya, bụ onye nke gosipụtara ihe a chọpụtara na ‘monitoring report’ atụmatụ ọlu ‘2017 Federal Capital Budget’ na ‘South East’.   Otunaya kwuru sị,“Atụmatụ ọlụ 2017 agaghị nke ọma ma ncha na steeti ndị ‘Sout East’.

“Okporo ụzọ nile adịghị mma; ka Gọọmentị Etiti mee nke ka mma na 2018; anyị nwere olile anya na Gọọmentị Etiti ga-eme ya.”

Dịka otu hụrụ maka nchọpụta siri kwu, ha nyochara ka atụmatụ ọlụ 2017 si aga n’obodo dị iche iche na steeti Abia, Anambra, Ebonyi, Enugu na Imo site na nkwado ndị obodo.

Ha kwukwara na ha chọpụtara na e mezughị ọkara ihe e kwuru na a ga-eme na zoonu ahụ.

Na mmalite ya bụ emume, Gọvanọ steeti Ebonyi ma bụrụkwa onye isi oche ndị gọvanọ mpaghara ahụ (SEGF), Chief David Umahi, kwuru (site n’aka onye nọchitere ya) na ndị ogbo ya (ndị gọvanọ) fooro ntutu ha taa maka mmepe okirikiri ha.

Otu osila dị, Gọọmentị Etiti agbaghaana nke a site n’aka onye minista na-ahụ maka mgbasa ozi na omenala bụ Alhaji Lai Mohammed na minister Babatunde Fashola nke ‘Power, Works and Housing’. Ndị minista a kwuru n’aka nke ha na gọọmentị etiti na anwa oke ya na mpaghara ahụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here