Ndị omekome a gbaala ụlọikpe abụọ ọkụ n’Imo

0
472
Ndi Imo

Chinwendu Uzoatu

 

NDỊ omekome e kwuru na ha ga-adị ihe dịka iri na ise n’ọnụọgụ etinyela ọkụ n’ụlọikpe majie (Magistrate Courts) abụọ n’ọkpụrụ ọchịchị Orlu na steeti Imo. Ọkụ a repịara akwụkwọ niile e ji edekọ ihe nke dị n’ụlọikpe ndị ahụ.

Ụlọikpe ndị ahụ bụ ‘Chief Magistrate Court 1’ na ‘Senior Magistrate Court 2’ ma bụrụkwa ụlọikpe e wunyere n’ogige ụlọikpe ukwu ‘Orlu High Court’.

Otu onye ọlụ n’ụlọikpe ukwu ahụ dị n’Orlu bụ onye na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara ndị nta akụkọ na ndị omekome ahụ bụ ndị nke ji egbe wee wakpo ndị nche ụlọikpe ukwu ahụ, ma were ike ha nile banye n’ime ụlọikpe abụọ ahụ, bupụta akwụkwọ nile e ji edekọ ihe nile mere n’ụlọikpe ndị ahụ ma mụnye ha ọkụ.

Onye ọgba ama a gara n’ihu kọwaa na ndị ọchọnganoko ahụ riri mbọmbọ nani mgbe ha hụrụ na akwụkwọ ahụ nile, tinyekwara ọtụtụ ngwa ọlụ ụlọikpe ahụ agbariena ọkụ pịata pịata ma ghọrọ ntụ.

Dịka o siri kwuo, ndị nche ahụ bụ ndị nke mmiri juru ọnụ nọ ebe ahụ n’amaghị ihe ha ga-eme mgbe ndị ọjọọ ahụ jiri laa.

O kwuru si, “ụlọikpe ndịa na-ekpe ikpe dịka ụlọikpe ndị ọzọ n’ụlọikpe ukwu Orlu si eme. O nweghị ihe mere n’oge gara aga nke a ga-asi na ọ bụ ya ka ihe dị otu a jiri mee. Nnyocha nke ndị uweoji ga-achọpụta ihe kpatara ọdachị a.”

Oge a kpọtụrụ ya bụ onye na-ahụ maka ọdị mma ndị mmadụ na ndị uweojii na steeti ahụm, (Police Public Relations officer), SP Andrew Enwerem, kwuru na ọ bụ ihe mere eme.

GUO:  Ọwa mmanụ asupuola na steeti Imo

Ya bụ okwuputa okwu ndị uweojii kọwara na kọmishọna ndị uweojii bụ Dasuki Galadanchi, agwala onye kọmanda nke mpaghara Orlu ka o bido nleba anya ozigbo maka ya bụ ihe.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here