Osodieme achịkọtala ngagharị ime-ime obodo

0
558
Osodieme

Izunna Okafor

 

NNUKWU ọñụ dara nnọọ ụbọchị Satọdee dịka nwunye aka na-achị steeti Anambra bụ Oriakụ Ebelechukwu Obianọ chịkọtara njem ahụ ọ bagidere ịgazu n’okpuru ọchịchị niile dị e nwere na steeti ahụ, bụ nke ọ malitere n’abalị asatọ nke ọnwa a.

N’okwu ya n’Awka n’okpuru ọchịchị Awka ‘South’, bụ nke so n’okpuru ọchịchị ikpeazụ ọ gara, Oriakụ Obianọ kọwara na isi sekpụ ntị na ya bụ njem bụ iji wee kpọtụrụ ndị bi n’ime ime obodo, nyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ n’ime ha aka, kwalite ezi ọnọdụ obibi ndụ ụmụ mmadụ, ma mekwa ka ndị enweghị olile anya nwee olile anya, bụkwa nke ọ na-eme site n’otu enyemaka ya ahụ a kpọrọ CAFÉ.

O mere ka a mara mkpa ọ dị icheta ndị nọ n’ime ime obodo na ndị ụwa na-atụ n’ọnụ nakwa inye ha nkwàdo oge niile, ma kpọkukwazie ndị aka ji akụ ka ha were akụ ha na-eleta ndị ụwa na-atụ n’ọnụ.

Oriakụ Obianọ gakwara n’ihu kpọkuo ndị ndu obodo dị iche iche ka ha gbaa mbọ ịhụ na akụrụngwa dị iche iche, ọ kachasị ebe nlekọta ahụike a rụnyere n’obodo ha na-arụ ọrụ nke ọma na otu o kwesiri site n’iwèta ozi banyere otu ha si arụ ọrụ oge ọbụla nakwa ime ka a mara ọnọdụ ihe ndị ahụ na mgbe na mgbe.

N’okwu nke ya, onye nọ dịka onyeisi ndị ọrụ nyere Gọvanọ Willie Obianọ, bụ Maazị Primus Ọdịlị kwuru na ya bụ ọrụ bụ nke magburu onwe ya, ma mee ka a mara na Oriakụ Obianọ na-esite na nke ahụ wee wulite mmụọ inye enye n’ebe ụmụ mmadụ nọ.

GUO:  Oriakụ Obiano ekeleela Ezeajughi maka idu ya n'iyi ọrụ dịka Meyọ nke Brent London, agba nke abụọ

Na ntụnye nke ya, osote okwupụta okwu ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti Anambra, bụ Maazị Harford Oseke kọwara mkpa ọ dị ịkwado ya bụ ọrụ ọma nke Oriakụ Obianọ iji hụ na ọ gara n’ihu n’imezupụta ebumnobi ya, ọbụnadị dịka ya onwe ya butekwara ihe e ji apàcha ntutu isi, bụ nke dị iri anọ n’ọnụ ọgụgụ, iji wee kwàdo ya bụ ọrụ ọma.

Ndị ọzọ sonyere na nchịkọta ya bụ ngagharị gụnyere onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Awka ‘South’ n’ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti ahụ, bụ Maazị Nnamdị Okafọr, Kọmishọna na-ahụ maka ihe metụtara ụmụ nwaanyị na ụmụ ntakịrị na ọdịmma ha na steeti ahụ, bụ Oriakụ Ndidi Mezue na ogbo ya nke na-ahụ maka ọrụ, bụ Maazị Marcell Ifejiọfọ, onyeisi ọchịchị nchere oge n’okpuru ọchịchị Awka ‘South’, bụ Maazị Leo Nwuba, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here