E mechiela ụlọ ọlụ na-emepụta osikapa n’Abakaliki

0
519

Chinwendu Uzoatu

 

GỌỌMENTỊ Ebonyi Steeti emechiela ụlọ ọlụ na-arụpụta osikapa nke a maara aha ya bụ ‘Abakaliki Rice Mill’ oge a chọpụtara ihe na-egbu mmadụ ya na osikapa adigboroja.

Onye kwuputara mmechi a e mechiri ụlọ ọlụ osikapa ahụ bụ onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ David Umahi n’ihe gbasara nchekwa ime obodo, Dr Kenneth Ugbala ka a nọ na ‘State Executive Council Chambers’ n’obi gọọmentị dịka ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu gbasara ihe e metere na ya bụ nzụkọ ndị isi goomenti steeti ahụ.

O kwuru si na  gọọmentị mere nkea n’ihi ama nke si n’aka ngalaba na-ahụ maka gburugburu ‘Ministry of Environment’ nke kwuru na osikapa adigboroja na nsị dị n’osikapa a na-eresi ndị mmadụ.

Ọ gara n’ihu kwuo na a ga-emeghekwa ya ma e mechaa nnyocha ma kpọchapụ ihe ndị ahụ dị njọ.

GUO:  N'Abakaliki, onye ara ejirila osisi kụgbuo onye ọgbatumtum

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here