Ewepụtala ndị isi oche nchere oge n’okpuru ọchịchị ụfọdụ n’Anambra

0
558
ndị isi oche

Izunna Okafor

 

A  NABATALA, mmadụ ise bụ ndị ga-ebughara oche dịka ndị isi oche nchere oge n’okpuru ọchịchị Anambra West, Anambra East, Orumba North, Awka North na Onitsha North n’otu n’otu.

Nke a bụ nke e mere site n’aka ndị ụlọ omebe iwu steeti Anambra n’ọgbakọ ha nwere n’isi ụlọ ọrụ ha dị n’Awka, bụkwa nke ha nọrọ na ya wee tụlee ma lebaa anya n’ụfọdụ ihe ndị ọzọ chere ha n’ihu dịka ndị omebe iwu steeti ahụ.

N’okwu ya dịka ọ na-ekwuwa nnabata ahụ, onye okwupụta okwu ụlọ ọgbakọ omebe iwu ahụ, bụ Ọkaiwu Rita Madụagwụ, kọwara ndị ahụ dịka ndị e nyochagoro ma chọpụta na ha tozuru òkè iji ya bụ ọkwa, dịka aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ siri wee họpụta ha ma zitere ha ndị ụlọ ọgbakọ omebe iwu ahụ.

Madụ ise ndị ahụ a nabatara na okpuru ọchịchị ha gụnyere: Maazị Sylvester Okafor (Anambra West); Maazị Pius Ifeadị (Anambra East); Oriakụ Ify Obinabọ (Orumba North); Ferdinand Ọnwụje (Awka North), tinyere Patrick Aghamba (Onitsha North)

N’ozi ekele ha, mmadụ ndị ahụ toro Gọvanọ Willie Obianọ, ọchịchị steeti Anambra nakwa ndị ụlọ ọgbakọ omebe iwu ahụ maka ịhụta ha dịka ndị tozuru oke wee họpụta ma nabata ha maka ijere steeti ahụ ozi. Ha kwekwazịrị nkwa iji ezi amamihe na ọgụgụ isi ha nwere wee rụọ ọrụ ha nke ọma ma mepụtakwa ihe a hụrụ anya n’okpuru ọchịchị ha dị iche iche, site n’inye aka Chineke.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here