Ị gbochi ndị ntorobịa ịlụ ọlụ akpụobi oge ndọrọndọrọ ọchịchị

0
662
youths and 2019 election

Uchenwa Mba

N’AFỌ na-abịa, ala anyị Nigeria ga-ahọpụta onye ga-achị ha n’afọ anọ ọzọ. Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị niile ga-achọ ka ọ bụrụ otu nke ha ga- enweta mmeri.

N’ihi na igwu okwe ndọrọndọrọ ọchịchị n’ala anyị bụ nke ndị nọ n’ime ya na-emekari ya n’ụzọ tigbuo zogbuo, ihe nwute dị n’okwu a bụ na ndị anya ha dị ọkụ ka ha rigoro n’oche ọchịchị a ma ọ bụ ka otu nke ha nweta mmeri a, adighị akpọpụta ụmụ ha.

Ụfọdụ n’ime ha na-akpọpụ ụmụ ha obodo oyibo ha a na-agụ akwụkwọ n’ụlọakwụkwọ dị mma, ndị nke ụmụ ha togworo eto a na-alụ ọlụ dị mma. Ndị a anya dị ọkụ na-abịazị, kpọrọ ndị ntorobia ndị ọzọ, mee ha ndị akpụ obi na ndị ha ji a lụso ndị out  ndọrọndọrọ ọchịchị ibe ha agha.

Ụmụ ntorobia ndị a – n’ihi na ọtụtụ n’ime ha enweghị ọlụ ha na-alu, ngwangwa e chere ha ego n’iru, ma ọ bụ kwe ha nkwa ego, ha esobe ha ma kwetakwa ihe ọ bụla e ziri ha mee.

Akwụkwọ nsọ kwuru na ego bụ mgborogwu ihe ọjọo niile ma ọ bụrụ na mmadụ ejighị uche zuru oke soo ya.Ha na-ekwu sị, kama ha a gaghị enweta mmeri, ha egbuo onye ha lere anya na ọ ga-anọchị ha ị nweta mmeri.Ọ bụkwa ụmụ ntorobịa ndị a akpọkọtara ka ha na-ezipụ ịga lulu ha ọlụ dị otu a.

Otu nwaanyị, aha ya bụ Elizabeth Okafor, zara ajụjụ ole na ole ma nyekwa ndụmọdụ gbasara otu a ga-esi gbochie ndị ntorobia ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ghara iji ha na-eme tigbuo zogbuo.

O kwuru na e nweghị ezi ọlụ ndị ntorobia ndị a na-alụ nke na-ebute ha ji ekwe aba n’ọlụ akpụ obi ahụ. “Ihe ọzọ na-ebutekwa ya bụ enweghị ezigbo ntọala, enweghị ezi ndụmọdụ n’ihi na onye ọ bụla nwere ezigbo ntoala, eziga ya igbu mmadụ ma ọ bụ igba ụlọ na ụgbọala ọkụ, ogaghị eje ọlụ dị otu a n’ihi na uche ya ga-agwa ya na ihe ọjọo ọ bụla mmadụ mere mmadụ ibe ya, na ọ ga- anata ụgwọ ọlu n’ikpeazụ”.

Nwaanyị a nyere ụmụ ntorobia ndụmọdụ ka ha ghara ikwe ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị a were ha jee ozi ọjọo ọbụla n’oge nhọpụta  ochịchị a ga-eme n’afọ na-abịa.

O kwuru n’ezie na ndọrọndọrọ ọchịchị abụghị ọlụ ọjọo kama na ọ bụ ihe mmadụ na-aga na mahadum gụọ ọtụtụ afọ. Ọ sịrị n’ọdịghị mgbe a na-akuziri ha ka ha gbuo onye ọbụla ha na ya ga-azọ ọnọdụ ọchịchị. Ihe na-ebutere ha ịgbụ ibe ha bụ obi ọjọo na anya ukwu.

Odoziaku Okafor kwuru n’okwesiri ka obodo ọbụla na-achịkọba ọzụzụ nkuzi nye ndị ntorobia ha nile maka ọghọm dị n’ọlụ tigbuo zọgbuo a na-eji ha alụ n’oge nhọpụta ndị ga-achị. Nke a ga-enye aka mee ka ndị ntorobia ghara ịdị na-enye onwe ha maka ịlụ ọlụ ọjọọ dị otu a.

O gwara ndị ntorobịa ka ha jụọ onwe ha ihe mere na ndị oke ozu a adịghị e ziga ụmụ ha ịlụ ọlụ ọjọo ndị a. O jikwa ohere a rịọ ndị ntorobịa ka ha nọrọ nwayọ n’oge a ga-eme nhọpụta onye ga-achị n’afọ na- abịa.

Maazi Pius Madueke, n’okwu nke ya, kwuru na ndọrọndọrọ ọchịchị bụ ihe a na- eme na mba ụwa nile, belụ sọsọ obodo ndị ọlụ agha na-achị . O kwuru na ihe kpatara nke ala anyị jiri dị iche bụ na ndị ala anyị na-ebukari ihe ọjọo n’obi imegide ibe ha.  Ndọrọndọrọ bụ ụzọ ka mma I ji chị obodo ọbụla maka na ọ bụ usoro onye kwuo uche ya..

Maazi Madueke gara n’iru kwuo na ọdịghị mma bụ ụzọ e si eme ndọrọndọrọ ọchịchị n’ala anyị oge ụfọdụ, mana ihe na eweta nke a bụ enweghị ọlụ dị n’ala anyị kemgbe ọtụtụ afọ.

Ewepụ I gbu mmadụ na ịgba ụlọ ma ọ bụ ụgbọala ọkụ,ihe ọzọ adighị mma e ji ụmụntorobịa eme n’oge nhọpụta n’ala anyị bụ na ọ bụ ụmụntorobia ka ha ji egwu ojoro, ọ bụ ụmụntorobia ka ha na-ezipu ịga butere ha akwụkwọ na igbe eji atụ vootu. Ọ bụkwa ụmụntorobia bụ ndị na-aga ha lee anya, ọ bụrụ na ọbụghị onye ha chọrọ na-emeri, ha ebulite ọgbaghara n’ebe a na-atụ vootu.

Maazi Madueke gwara ụmụntorobia ka ha kpachapụ anya ha maka na onye e gburu adịghị apụta ọzọ.

O kwukwara n’onye e jidere mere ihe ọjọọ n’oge nhọpụta na ndị ziri ha ma ọbụ ndị ha na alụlụ ọlụ ọjọọ ndịa agaghị abia ịgbapụta ha n’ihi na ndị ukwu ndị ahụ a gaghị achọ ka a mara na ọ bụ ha ka a na-alụlụ ọlụ ahụ.

Ọzọkwa, ọ gwara ụmụntorobia ka ha kwụsị iche nanị ọlụ oyibo, ka ha tinye onwe ha n’ịlụ ọlụ ndị ọzọ dịka ọlụ aka dị iche iche, ọlụ ugbo, ịzụ ahịa na ịnya ụgbọala. O kwuru na mgbe ọbụla mmadụ na-eme ihe bara uru, n’ọgaghị enwe ohere ile ndị na-ebugharị ego a maghị ebe ha si anya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here