Ndị Ebenatọ eriela ji ọhụrụ

0
803
Ebenatọ New yam Festival
  • Rịọ enyemaka gọọmenti maka mbize ha

Izunna Okafor

Ọ BỤ nnọọ ụwa bịa kirie ụbọchị Tuzdee gara aga, dịka ndị obodo Ebenatọ dị n’okpuru ọchịchị Nnewi South nke steeti Anambra mere mmemme iri ji ọhụụ ha nke ahọ 2018.

Ya bụ mmemme bụ nke weere ọnọdụ n’obi eze ọdịnala obodo ahụ dị n’Ụmụnnama Ebenatọ, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị mmadụ sitere n’ime obodo ahụ na mpụga ya.

N’okwu ya n’oke mmemee ịwa ji ahụ, eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Edwin Chinaewubeze Ezejiburu (Obi nke mbụ n’Ebenatọ), kọwara iri ji ọhụụ dịka otu n’ime mmemme pụrụ iche e jiri mara Igbo niile nakwa dịka ihe mbụ a na-eme n’obodo tupuu ndị obodo ahụ amalite iri ji ọhụụ n’ezinaụlọ ha dị iche iche.

O toro Chineke onye mere ka ha dị ndụ wee gwuputa ji ha tinyere n’ala, ma kpekwazie ekpere maka ogologo ndụ, ahụ isi ike na ọganihu nke ụmụafọ obodo ahụ, ndị Igbo na ala Nigeria n’izùgbe.

N’ajụjụ ọnụ a gbara ya na mmemme ahụ, otu nwa amadi na-esonyesi ike n’ihe a na-eme n’obodo ahụ ma bụrụkwa onye e chiri echichi dịka Ọnwa Ebenatọ, bụ Chiifu Emeka Mkparụ kọwara iri ji ọhụụ dịka ọmarịcha omenala Igbo kwesiri inye ezi nkwàdo, ma tokwa ndị obodo ahụ niile otu ha siri wee nuputa n’igwè n’isonye na ya bụ oke ihe mmemme. O mere ka a mara na omenala Igbo kwesiri ka e nye ya ezi nkwàdo ka o wee ghara ịnwụnahị anyị ma ọ bụ nyụọ dịka ọkụ.

N’okwu ha n’otu n’otu, osote onyeisi ọchịchị obodo ahụ bụ Ọkaiwu Francis Ndụbụọgaranya nakwa ode akwụkwọ n’obi eze (aka eze) bụ Chiifu Cyprain Okeiche kọwara mmemme iri ji ọhụụ dịka nke magburu onwe ya nakwa omenala pụrụ iche e ji akwanyere ji ugwu dịka eze ihe niile a kọrọ n’ugbo.

GUO:  Emume iri ji ọhụrụ n’omenala Igbo

 

Ha mere ka a mara na iri ji ọhụụ nke ahọ a gara nke ọma ma dọtakwa ọtụtụ mmadụ karịa ka a tụrụ anya, na-agbanyeghị na ha ezubeghị ime ya n’ụzọ kworo ekwo n’ihi ọnwụ Onowu obodo ahụ, bụ Chiifu Felix Okafọr, bụ onye hapụrụ ụwa a n’ime ahọ a.

N’ihe gbasaara ọrụ mmepe ime-ime obodo, ha jiri ohere ahụ too aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka mbọ dị iche iche ọ gbagoro na mmepe obodo ahụ, ọ kachasị site n’ego ahụ o nyere obodo niile dị na steeti ahụ ka ha wee họrọ ma rụọ ihe na-akpa ha.

Ha mere ka a mara na ndị obodo ahụ jiri ego nke ha wee rụọ ụlọ ọgbakọ ezumezu ma were nke abụọ wee rụọ ọmarịcha ọdụ ahịa n’ahịa obodo ahụ bụ Orie Nwankwọ; ma kpọkukwazie gọọmenti steeti ahụ na gọọmenti etiti ka ha biko gbatara obodo ahụ ọsọ enyemaka n’ebe o metụtara okporo ụzọ n’ihi nsogbu enweghị ezi okporo ụzọ, bụ nke bigoro obodo ahụ aka ọjọọ, nakwa mbize obodo ahụ, bụ nke kpagoro ọtụtụ mkpamkpa dị iche iche n’ime obodo ahụ, bibie ọtụtụ ndụ ma kwatuokwa ọtụtụ ụlọ na ihe onwunwe ndị ọzọ dị iche iche.

N’azịza ajụjụ ọnụ a gbara ya banyere mmemme iri ji ọhụụ na ala Igbo, ‘Rev. Fr.’ Johnpaul Ọnyịlọha, bụ onye ozi Chineke nọ n’ụlọ ụka ‘St. Matthew’s Catholic Church, Ebenator’ mere ka a mara na iri ji ọhụụ bụ omenala magburu onwe ya n’ala Igbo, ma kọwaa na o nweghị ihe ọbụla jikọrọ iri ji ọhụụ na ikpere alụsị dịka ụfọdụ si ekwu.

GUO:  Ndị Nanka eriela ji ọhụrụ

Ọ katọkwara otu ọtụtụ ndị Igbo si ahụta iri ji ọhụụ dịka ikpere arụsị na ihe ndị ọgọ mmụọ, ma kpọọ oku ka ndị na-eche ihe dị otu ahụ gbanwee echiche ha n’ihi na nke ahụ so n’otu n’ime ezi omenala dị iche iche sitere n’aka ndị nna nna anyị ha wee rute anyị aka, ma bụrụkwa nke kwesiri ka e nye ya ezi nkwàdo.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here