Nnewi South emeela mmemme ọgbụgba afọ iri abụọ na asaa

0
680
Nnewi South Anniversary

Chie Obianọ Ebubeagụ

 

Izunna Okafor, na Iyke Ọkpankụ

N’IHI na e kwuru na ezi ihe dị mma nchèta, nnukwu ọñụ dara nnọọ ụbọchị Mọnde n’okpuru ọchịchị Nnewi South, dịka obodo iri mejupụtara okpuru ọchịchị ahụ nuputara nnọọ n’ìgwè wee merube oke mmemme iji wee cheta na okpuru ọchịchị ahụ agbàala ahọ iri abụọ na asaa.

Ya bụ mmemme, bụ nke weere ọnọdụ n’Ụkpọr bụ isi obodo okpuru ọchịchị ahụ, dọtara imirikiti ụmụafọr sitere obodo niile mejupụtara ya bụ okpuru ọchịchị, ndị ọrụ gọọmenti, ndị ụlọ ọgbakọ omebe iwu, ndị nwere ụlọ mmepụta ngwaahịa, ndị isi ụlọ ọrụ dị iche iche, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ dị iche iche e ji okwu ha agba ìzù na na mpụga ya.

N’okwu ya na mmemme ahụ, nwa amadi haziri ya bụ ọgbakọ, ma bụrụkwa onyeisi oche nchere oge n’okpuru ọchịchị Nnewi Sawụtụ bụ Maazị Felix Odụmegwu (Omus Kakaka) mere ka a mara na ebumnobi mmemme ahụ bụ iji wee ñụrịa maka na okpuru ọchịchị ahụ agbaala ahọ iri abụọ na asaa e jiri kepụta ya, dịka o so n’otu n’ime okpuru ọchịchị dị iche iche e kewapụtara n’abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Ọgọstụ ahọ 1991, bụkwa ụbọchị e kewapụtara steeti Anambra ugbu a site na Anambra Ochie.

O kwuru na isi okwu mmemme ahụ nke ahọ a bụ: Nnewi South: Mgbe Gara Aga, Ugbu a, na Ọdịnihu; ma gaa n’ihu kọwaa na n’ezie n’ezie, okpuru ọchịchị ahụ esigo n’ogoogo baa n’ogoogo dị elu ma sikwa na mmepe baa na mmepe dị elu, malite na mgbe e kewàpụtara ya wee ruo n’oge ugbu a.

GUO:  Nnewi South na ndị FRSC ejikọọla aka ibelata ihe mberede okporo ụzọ

Ka ọ na-ekwu bànyere ọdịnihu okpuru ọchịchị ahụ, Maazị Ọdụmegwu gara n’ihu mee ka a mara na ọ na-atụ anya na oge adịghị anya, na a ga-ahọrọ o pekata mpe, ahịa atọ n’ime okpuru ọchịchị ahụ a ga-edozigharị ma wulie nke ukwuu ka ọ dịzie n’ogoogo nnukwu ahịa nkwọ Nnewi ahụ na-ewu ewu na mba ụwa.

Ọzọkwa, ọ sị na okpuru ọchịchị ahụ ga-ehibe ụgbọala ọhaneze, bụ nke ga na-ebugharị ndị mmadụ n’ime okpuru ọchịchị ahụ nakwa site n’okpuru ọchịchị ahụ baa n’okpuru ọchịchị ọzọ; ma kwukwa na a ga-eguzobe nnukwu ụlọ ebe a ga na-akụziri ma na-amụgosi ndị ntorobịa si n’okpuru ọchịchị ahụ ọrụ aka dị iche iche.

O kelezikwara aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka ọrụ ọma ya dị iche iche ọ rụpụtagoro na mpaghara ahụ na ọrụ mmepe o wetagoro n’ime-ime obodo dị iche iche dị n’okpuru ọchịchị ahụ, ma jaa ya mma ka o jide ka o ji, ọ bụnadị dịka o kwere ha nkwa na ụmụafọ Nnewi South niile kwụ ya chịm-chịm n’azụ.

N’okwu nke ya, onyeisi oche na mmemme ahụ ma bụrụkwa kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi, omenala na njem nlegharị anya na steeti ahụ n’oge gara aga, bụ Maazị Maja Umeh, kọwara mmemme ahụ dịka nke magburu onwe ya n’ihi na ihe dị mma kwesiri omume, tinyekwuoro na nwa gbara ahọ iri abọụụ na asaa abụghịzị nwata.

O mekwara ka a mara na okpuru ọchịchị ahụ anọdịla n’ezi ọnọdụ dị elu ugbu a, zụpụtakwa ọtụtụ selitere isi n’ala anyị, ndị e ji okwu ha agba izù na ndị mepụtagoro ihe dara ụda na ngalaba dị iche iche n’ala anyị; ma kwuo na a ga-anọkwa n’ụbọchị ahụ wee nye ọtụtụ n’ime ndị ahụ onyinye nkwanye ugwu dị iche iche iji gbàá ha ume.

GUO:  Nnewi South na ndị FRSC ejikọọla aka ibelata ihe mberede okporo ụzọ

Na ntụnye nke ya, otu onye n’ime ndị kwuru okwu na mmemme ahụ ma bụrụkwa onyeisi ụlọ ọrụ “Chisco Transport Company” bụ Maazị Chidị Anyaegbu, lebara anya n’ihe dị iche iche okpuru ọchịchị ahụ meputagoro malite mgbe e kewaputara ya wee ruo oge ugbu a, ma kọwaa n’ezie na ezi olile anya dịịrị ya bụ okpuru ọchịchị ugbu a na n’ọdịnihu.

N’iji too aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka ọrụ ọma dị iche iche ọ rụpụtagoro n’okpuru ọchịchị ahụ na steeti ahụ n’izugbe, a nọrọ na mmemme ahụ n’otu ụbọchị ahụ wee chibe ya bụ gọvanọ echichi dịka “Ebube Agụ Nnewi South”, bụ nke e chibere ya site n’aka otu jikọtara ndị eze ọdịnala obodo niile nọ n’okpuru ọchịchị ahụ.

N’otu aka ahụ, ọka okwu ụlọ agbakọ omebe iwu steeti Anambra bụ Oriakụ Rita Madụagwụ, bụ ezi nwaafọ ndị okpuru ọchịchị ji eme ọnụ, bụkwa onye a nọrọ n’ụbọchị ahụ wee chibe echichi dịka “Anyanwụ Na-Etiri Ọra Na Nnewi South”, site n’aka ndị eze ọdịnala ahụ.

Ndị ọzọ e chibere echichi pụrụ iche na mmemme ahụ gụnyere Maazị Leo Ike-Okoye, onye e chiri “Ihe Anyị Ji Aka Mba”; Maazị Chịdị Anyaegbu, bụ onye e chibere “Oke Iyi Nnewi South” ; Maazị Peter Ojiaka, bụ onye e chibere “Okwute Mmiri Nnewi South”, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

A nọkwara na mmemme ahụ wee nye ọtụtụ ụmụafọ okpuru ọchịchị ahụ onyinye nkwanye ugwu dị iche iche iji  gbaa ha ume n’ọrụ ọma dị iche iche ha rụpụtagoro n’ọnọdụ mmepe na nkwalite ọdịmma okpuru ọchịchị ahụ.

 

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here