Nwa okorobịa akwụọla ụdọ n’ihi anwụrụ ike ọñụfere oke

0
1121
anwụrụ ike

Chris Anyichie

 

NdỊ uwe ojii n’ Enugu steeti ebidola ime nyocha maka ihe mberede mere nwa nwoke di afọ iri abụọ na anọ ịkwugbu onwe ya ka ọñụfechara anwụrụ ike oke.

Onye nkwupute okwu ndị uwe ojii n’Enugu Steeti,bụ Ebere Amariazu, kwupụtara nke a n’ okwu ya n’ụbọchị monde n’ Enugu.O kwuru na ihe mberede a mere na mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na anọ nke onwa Ọgọọst na Ameke na Enu-oduma dị n’ Enugu Steeti.

Amariazu kowaputara aha nwa nwoke a nwụrụ anwụ dịka Ebube Chukwu. O kwuru na Ebube Chukwu bụ onye ekwupụtara n’ọkwụgburu onwe ya ka ọṅụchara ihe ọ na añụribu na mbụ bụ anwụrụ ike, nke a maara dịka ‘Igbo’.

Ozi e nwetere na – ekwu na onye ihe a mere amaghịkwa onwe ya, nke mere o jị kwụgbuo onwe ya n’ elu osisi n’ime ọhia n’ Obokolo, nke di n’etiti Amorji na Ameke Oduma.

“Achọpụtakwara na nwoke a bụ onye na- anụ anwụrụ ike mgbe ọbụla nke kpatara ihe mberede a.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here