Otu nwaanyị eleela nwa izu ụka isii, zụta ekwentị

0
745
ekwentị

Chris Anyichie

 

NDỊ uwe ojii nke Edo steeti ebidola nyocha maka orire erere nwa dị naani ịzụ ụka isii site na aka nne ya bụ Miracle Johnson, onye nke dị afọ iri abụọ na atọ.

Kọmishọna ndị uwe ojii na steeti ahụ bụ Maazi Johnson Kokumo,bụ onye gbara aka ebe ihe mberede a, kwuru na ọ bụ nnukwu ịwu ka ọ dara. Site n’akụkọ ndị ekpokọbara, a chọpụtara na Miracle rere nwa ahụ bụ ‘Greatness’ na ebe ndị na enweghị nne na nna na-anọ na Onitsha, Anambra steeti O rere ya naani puku naarị naịra na iri abụọ.

Achọpụtara na nwaanyị na eledoro ya nwa anya bụ onye Agenebode na Etsako East dị n’okpuru ọchịchị Edo Steeti bụ onye kwụnyere ego ya ozigbo.

Ekwuru na o ji ụfọdụ ego o nwetara n’ime nwa ahụ were zụta ekwenti. Mana Miracle, bụ nne ụmụ abụọ, tara onwe ya ụta maka ihe omere n’ihi ngharipu di ya nakwa n’ihi na di ya enweghi ike ilekọta ya na ụmụ ya anya.

Okwuru sị na ọ bụ Mama Joy bụ onye kwagidere ya ka oree nwa ya were  ego onwetara nye di ya ka o were bido ahia.

Okwuru na ya mụrụ nwa a na mkpụrụ ụbọchi abụọ di n’onwa Julai.” Elelem ya n’ihi ngharipu. Dị m na adọgbukwa onwe ya ịchụta ihe anyi ga eri. Ọyi m nwaanyi (Mama Joy) kwuru na ebe ọ bụ na di m anaghị elete m anya,ọ  bụrụ na m mee ya (lee nwa m) aga m enye di m ego a ka o wee bido izụ ahia ma ọ bụ zụta ọgba tum tum.Ka izụ ụka gachara, ọlachite, amaghi m ihe o mere m nwee buru akpa were ụfọdụ ihe wee pụọ”.

GUO:  Ekwenti: Uru na ọghọm ya

“Elelem ya na ebe ụmụaka na enweghi nne na nna nọ n’Onitsha.Ha zụkwara ya puku naari na abụọ.Azụtara m naani ekwenti,achọghim ịzụta ya mana (Mama Joy) kwanyere m ka m mee ya”.

Miracle kwuru na owutere ya n’ihe o mere o wee mechaa gwa otu onye ozi chineke n’ụlọụka ya maka ihe o mere na “ọbụkwa na amaghi ama na agahịm enwekwa ike ịgbaghara onwe m.Ya mere m na di m ji gaa na nke ndị uwe ojii ikpesara ha ihe mere. Ama m na ihe m mere adịghi mma.A nam ekpe ekpere ka nwa m gbaghara m.”

Dị ya bụ Johnson Omuvuokpor, gosiri iwe na nwunye ya mere ihe okpara nkata ya, na agbanyeghi na okweghi.

Okwuru, “mgbe ọ gwara m ihe o chọrọ ime, a gwara m ya ka ochefụo ya ma nwee ndidi. N’ụbọchi ahụ,eburu m ọgba tum tum ịga dozie ya mgbe m gara n’ụlọ ịweta ego, ahụrụ m nwa m nke izizi ka ya na ndị agbataobi m nọ.Mgbe m jụrụ ebe nwunye m nọ,a gwara m na o gara ịzụta ihe nwee cheta ihe o kwuru na ọ ga e ji nwa wee mee.

Mgbe omechaala kpọọ m na oge ehihie ka ogwara m na olego nwa, nwee baara ya mba ma gbanyukwaa ekwenti m, nwee nọdụ na ngbagwojuanya, onwekwaghi ihe m mere ụbọchi ahụ nile”.

Komishọna ndị uwe ojii na steeti ahụ kwuru na ọ ga agbapụta nwa ahụ ma kpọrọkwa onye mere ihe a kpụga n’ụlọikpe.

Kokumo kwuru na agwa a nwaanyi a kpara bụ ihe megidere iwu nke Nigeria.O kwukwara na ebe anyi ji nwaanyi a na-aka, anyi ga akpụgariri ya ụlọikpe. Aga azọpụtakwa nwa a”.

 

 

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here