NDỊ ‘Nigeria Security Civil Defence Corps’ anwụchikọọla otu nwa okorobịa maka ịmebi ọkụ nakwa ịkwatu ihe akpụrụ-akpụ nke Dokinta Akanu Ibiam n’Abacha ‘Round About,Gunning Road’ n’Abakaliki nke Ebonyi steeti.
Dika onye akaebe si kwuo, nwoke a ji ‘monday hammer’ nakwa akọrọngwa ndị ozo wee bịa na gburugburu ahụ,rigoro n’elu ebe mmiri si awụdata, nke ndị bekee kpọrọ ‘Water fall’ wee bido mebisibe ya.
Tupu o bido,o kwuru na ọ nwere ọgwụ ogwọrọ nke enili na,’round about’ tupu e tinye ọkụ ndị ahụ,mere na ndị na-azu ahịa na Abakpa nakwa ndị Abakaliki bụ ndị ajọ ihe a jisi ike n’obodo, ime ka ha ghara ịga n’ịrụ nakwa ịjụ maka oke rulụ ha.
E kwukwara na owepụtara ụfọdụ ihe na ala ị ji wee gosi ndị n’ele ya anya nakwazi ndị na-azu ahịa n’ahia ahụ na nzọpụta ha adịgo n’ihi na o wepụgo ihe bụ ọgbata uhie n’ụzọ ha.
Ọ rịọkwara ndị mmadu ka ha ghara ichegbuụ onwe ha maka ihe ga-adakwasị ya n’ihi na ọ bụ mmụọ nsọ zitere ya,maka na onye zitere ya agaghị ahapụkwa ya.
E kwukwara na onye isi ala anyi bụ Mohammadu Buhari, na mkpụrụ ụbọchị iri anọ nke onwa Nọvemba n’afọ pụkụ abụọ na iri na asaa, bịara maka ngosiputa ihe akpụrụ-akpụ nke nna na onye ndu bụ ‘late Ezeogo’ Dr Akanu Ibiam nke Ebonyi steeti.