DỊKA akụkọ gara n’ihu na-agbasawanye, gọọmenti ala anyị ekwela nkwà ịgbata ọsọ enyemaka na ya bụ ‘ọgbara ụwa gharịị’ dapụtara na Nnewi, bụ ebe e kwuru na otu mmiri dị n’ime ọhịa takpọrọ wee ghọrọzie okwute na icheku na-ere ọkụ ma na-esikwa ajọ isi.
Ya bụ ajọ ọnọdụ bụkwa nke e kwuru na ajọ ísì ahụ na-esí na ya apụta egbuola mmadụ iri na ise n’obodo ebe ahụ ya bụ ihe nọrọ wee mee, bụ ime ógbè Umuozu dị n’ógbè Otolo dị n’okpuru ọchịchị Nnewi North nke steeti Anambra.
Nkwuputa a bụ nke e mere ka a mara site n’ọnụ mịnịsta obere nke ala anyị na-ahụ maka igwupụta ihe n’ala, bụ Maazị Abubakar Bwari, site n’ozi ọ kụpụrụ nso nso a, ma bụrụkwa nke onye enyemaka pụrụ iche nye ya bụ mịnịsta na mgbasa ozi, bụ Maazị lshaku Kigbu, binyere aka na ya.
O mere ka a mara na o nweela ndị e zipụrụ site na mịnịstịrị ahụ maka ịgaru ma were anya ha hụ ebe ahụ ya bụ ihe mere, ma sị na bụ otu ụzọ kacha mma a pụrụ isi wee gbasoo ya bụ ọnọdụ.
O kwukwara na ndị ahụ e zipụrụ kparịtakwara ụka, ha na ndị obodo ahụ ajọ ọnọdụ ahụ dabidoro, ma leruokwa ya bụ icheku anya nke ọma, ya na ísì ya na ikuku mmụọ ahụ na-esi na ya apụta, iji wee mara ụdị ikuku mmụọ ọ bụ na ihe a ga-eji wee gbochie ya ma ọ bụ kpàá ajọ ọnọdụ ahụ eze.
Maazị Bwari kwara arịrị banyere mkpesa ahụ ha natara banyere mmadụ iri na ise ndị ahụ tufugoro ndụ ha n’ihi ya bụ ihe, ma kọwaa na dịka ndị ahụ gara ebe ahụ siri kwuo, e nwere ebe mbize na-enye nsogbu n’obodo ahụ n’akụkụ ebe ya bụ ihe ahụ mere, nke mezịrị ka ikuku mmụọ nke icheku ahụ si n’akụkụ ebe ahụ wee na-ekupútasị.
O mezịrị ka a mara na ọkụ, ikuku mmụọ na ísì ọjọọ dị iche iche na-esi n’ụdị ihe ahụ apụtasị oge ọbụla, bụkwa nke adịghịdị mma chaa chaa n’ebe o metara ọnọdụ ahụike na obibi ndụ ụmụ mmadụ, ma sịkwazie na mịnịstịrị ahụ enyela ntụzi aka ka e mee nnyocha ọzọ miri emi iji wee mara ụdị ísì na ikuku mmụọ dị ihe ahụ si ebe ahụ asụpụtasị na ihe ọ pụrụ ime na ndụ mmadụ, ihe a kụrụ n’ubi ma ọ bụ anụmanụ, ka ha were mara etu a ga-esi soo ya.