E MEELA ka a mara oke mkpa ọ dị, bụ mmadụ ịma agụ, ịma ede, nakwa ịmụta ọrụ aka dị iche iche, dịka ụwa na-atụgharịzị atụgharị ugbu a.
Nke a bụ nke e mere ka a mara site n’ọnụ otu nnukwu mmadụ e ji okwu ya agba izu, ma bụrụkwa onye nọgodi ugbu a dịka onyeisi ọba akwụkwụ Ọkammụta Kenneth Dike dị n’Awka, bụ Dọkịta Nkechi Udenze, n’okwu ya na mmemme imerùbe ncheta ụbọchị ịma ede na ịma agụ na mba ụwa, nke ahọ 2018, ma bụrụkwa nke a chịkọbara na steeti Anambra site n’aka ọba akwụkwọ ahụ.
Ọ kọwara ịma agụ na ịma ede dịka ihe dị oke mkpa na ndụ mmadụ ma bụrụkwa nke kwesiri ka a kwàlite ma kwàdo ya nke ọma n’ihi ọtụtụ uru dị iche iche ọ na-eweta na ndụ onye ahụ na mmepe obodo n’izugbe.
O kwuru na oge agaala mgbe a na-asị na ịgụ akwụkwọ bụ ihe dịịrị naanị ụmụ aka ma ọ bụ ụmụ na-eto eto, ma sịkwazie na onye ọbụla kwesiri ịma ede na ịma agụ ugbu a na n’oge ọgbara ọhụụ a, ma ụmụaka, ma ndị ntorobịa nakwa ndị okenye.
N’ịgbakwasa ụkwụ n’isi okwu mmemme ahụ nke ahọ a bụ ‘Ịma Ede Na Ịma Agụ Na Ịkwalite Ọmụmụ Ọrụ Aka Dị Iche Iche’, Dọkịta Udenze gara n’ihu kọwaa na ọ bụ ezie na ịma ede na ịma agụ agụ dị mma, mana mmadụ ịmụta ọrụ aka dịkwa oke mkpà, tinyere mmadụ ịma ka e si eji igwe omecha ncha bụ kọmputa were eme ihe, nakwa otu e si eme ihe dị iche iche ugbu a n’usoro ọgbara ọhụụ dijitaalụ.
Ọ sị na nke a bụ n’ihi etu ọnọdụ ala anyị siri debe imi na ọnụ ugbu a na ihe ndị ọzọ na-emegasị n’ime ya, dịka enweghị ọrụ.
O toro aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ na mbọ dị iche iche ọ na-agba esepụghị aka, iji hụ na ụmụafọ steeti ahụ na-esonyesi ike n’ihe niile ahụ, malite n’ịgụsi akwụkwọ ike wee ruo n’ịmụ ọrụ aka dị iche iche, ma kpọkùkwazie ndị aka ji akụ na ndị otu dị iche iche ka ha tụnye ụtụ nke ha n’ịkwàlite agụm akwụkwọ na ọmụmụ ọrụ aka.
N’okwu nke ha n’ajụjụ ọnụ a gbara ha n’otu n’otu, ụfọdụ n’ime ndị sonyere na mmemme ahụ, nke gụnyere Oriakụ Nwọfọr Florence, bụ onye nkuzi na ngalaba ihe ọmụmụ nhazi ọba akwụkwọ na ozi na mahadum Nnamdị Azikiwe dị n’Awka; Oriakụ Chinwe Okonkwọ, bụ onye ọrụ oyibo n’ụlọ ọrụ na-ahụ maka ego a na-enweta n’ime steeti Anambra,
tinyere obere nwaada Chideraa Chịma, sitere ụlọ akwụkwọ ‘Capital City’, kọwara nnukwu ihe mmemme ahụ dịka nke magburu onwe ya, kpọpụtasịa ọtụtụ ihe dị iche iche ha mụtara na ya, ma kpọkwazie oku ka a na-akwàdo ihe mmemme dị otu ahụ n’ụzọ pụrụ iche n’ihi oke uru nke ahụ ga-eweta na ndụ ụmụ mmadụ ma na mmepe obodo.
Nnukwu ihe mmemme ahụ bụ nke dọtara imirikiti mmadụ, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee nye nkuzi banyere ọtụtụ ihe dị iche iche , dịka o siri metụta etu e si ede ede, etu e si agụ agụ, etu e si eji igwe komputa eme ọtụtụ ihe dị iche iche n’usoro ọgbara ọhụụ dijitaalụ nakwa etu e si arụpụtasị ihe dị iche iche e ji aka eme, nke gụnyere àkpà, àkụpè, ise ihe osise na ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị iche iche.