ABALỊ iri nke ọnwa iteghete n’ọnwa a ka ụmụakwụkwọ steeti Anambra bidoro akwụkwọ nke afọ 2018 – 2019. Ezinaụlọ ọbụla ka nwere ụmụaka nọ na ntakara, primarị na sekọndịrị na-agba mbọ otu ha ga- esi kwado ụmụ ha nke ọma n’ibido akwụkwọ a. Nke a gunyere ndị nọ n’obodo mepere emepe na ndị nọ n’ime obodo.
Nke a meziri na ị gaa n’ahịa ugbua, ịbaa ebe a na-ere akwụkwọ, akpụkpụ ụkwụ, akwa akwụkwọ, efere e ji ebu nri aga akwụkwọ na ihe e ji ebu mmiri ọñụñụ, ị gaghị ahụ ụzọ maka na ọtụtụ ndị na- ego ihe ndị a. Otu aka ahụ, ị gaa ebe a na-akpa isi, ị ga ahụkwa ka ụmụaka jupụtara ebe ahụ.
Ị baa n’ụlọakwụkwọ nile ugbua, ị ga ahụkwa ọtụtụ ụmụaka ka ha juru ma ndị nke na-ebido ọhụrụ ma ndị nke chọrọ ịgbanwe ụlọakwụkwọ. Oge a bụkwa oge ndị nkuzi ji enwe ọlụ.
Otu nwanyị n’ere ahịa na UNIZIK ochie, aha ya bụ Nkeiru Chukwu kwuru ihe ndịa maka mbido akwụkwọ a.
Na mbụ, ọ sịrị na obi dị ya ụtọ n’ihi na oge a, ahịa na-aga nke ọma. Nwanyị a bụkwa onye na ere akpa akwụkwọ, akpụkpụ ụkwụ, akwa ụmụakwụkwọ na-eyi n’ime nakwa akwa nche mmiri na nke e ji ekpuchi oyi. Ọsiri na ihe ndị a nile etinyeghị nnukwu ego mana ụfọdụ ndị enweghị ego ha tụrụ anya ya na-asị na ihe garara ọnụ.
Mgbe ajụrụ ya maka ndị nwere ọtụtụ ụmụaka, ọ sịrị na onye ọbụla nwere ọtụtụ ụmụaka kwesịrị ibido n’ihe dịka ọnwa asaa ma ọ bụ ọnwa asatọ kwadobe ihe ụmụ ya ga-eji bido akwụkwọ mana ọ bụrụkwa onye ha maara nke ọma, na ha na-eresị ya ahịa ma ọ kwụnye ego ole o ji, emesia, ọkwụtọpụ nke fọdụrụ.
Ajụkwara ya ma ha na azụgide ahịa ihe ụmụakwụkwọ ruo ọnwa ole owe belata, ọ sị na ọ na-erucha ọnwa abụọ ma ọ bụ abụọ na ọkara.
Ọ sịrị na ihe mere ọtụtụ mmadụ ji e ju n’ahịa n’oge aọ bụ maka na mmadụ nile na-ejezi akwụkwọ ugbua, ma ndị e ku n’aka.”Nke ọzọ, onye ọbụla chọrọ ka ụmụ ya soro n’ihe a na-eme na agbanyeghị nnukwu ego a na akwụ n’ụfọdụ ụlọakwụkwọ nke otu onye nwe. Nne na nna ọ bụla na-agba mbọ ka ụmụ ya sonye na ihe a na-eme nke gosiri na ndị ala anyị matara ụrụ dị na agụmakwụkwọ”.
Onye nke abụọ, aha ya bụ Oge Chukwu, n’obere ajụjụ a jụrụ ya maka mbido akwụkwọ a sịrị na oge a bụ eze a ma na ọ ga-echi. Ọ siri na nne na nna ọbụla maara na ezumike gasịa, na a ga-ebido akwụkwọ. “O kwesiri ka nne na nna kwadoo ụmụ ha tupụ mbido akwụkwọ eruo n’ihi na ọ bụghị na mberede ka oge a biara”.
Ọ rịorọ gọọmentị ka o lebaa anya n’ihe gbasara akwụkwọ ọgụgụ ụmụakwụkwọ ka ndị na ebipụta akwụkwọ ndị ahụ na-ewetụ aka n’ego ole ha na-ere ya ka aka onye ọbụla na-eru ịgote ya maka na nwa akwụkwọ enweghị akwụkwọ ọgụgụ dị ka onye jere ọlụ ubi ma ojighi mma ma ọ bụ ọgụ.