NDỊ oji egbe agbagbuola otu ụkọchukwu ụka Katolik ma buru ụgbọala ya laa na Nkwerre, nke dị n’okpuro ọchịchị Nkwere na steeti Imo.
Ndị oji egbe ahụ gbagbukwara otu nwoke ọzọ, nke ya na ụkọchukwu ahụ so n’ụgbọala.
Ụkọchukwu ahụ bụ ‘Rev Fr’. Jude Egbuom, bụ ụkọchukwu nke ‘St Patrick’s Catholic Church, Amucha, n’okpuro ọchịchị Njaba na steeti ahụ. Ọ bụ onye Umuwala nke dị na Nkwerre.
Ndị ahụ wakporo ya n’ihe dịka elekere asatọ nke abali na Monde, ka ọ gara ebe a na-akpụ isi n’okporoụzọ sitere Anara gaa Nkwerre nke dị na Nkwerre.
Ndị ohi ahụ gbara ọsọ ka ha gbagbuchara fada ahụ na onye o bu n’ụgbọala.
Otu onye obodo ahụ kwuru sị, “ka ihe siri dịrị gbasara ogbugbu e gburu ya bụ ụkọchukwu na-egosi na ọ bụ ndị oji egbe ezu ohi mere ya.
“Onweghị ka ọ bụrụ ndị e ziri ezi ka ha gbuo ya.Onye ka onye ụkọchukwu na-achọghị nsogbu mejọrọ? O si n’obodo anyị, Nkwerre, ma na-alụ ọlụ mgbasa ozi ya na Njaba nke dị n’okpuru ọchịchị dị anyị nso.”
Oge a kpọtụụrụ ya, onye na-ahụ maka ọdị mma ndị mmadụ na ndị uweojii, Andrew Enwerem, kwuru na ya bụ arụ mere n’eziokwu ma kwukwaa na kọmishọna ndị uweojii bụ Dasuki Galadanchi, ezigala ndị uweoji ọ bụ ọlụ ha ‘Tactical Unit of the Command’ n’ebe ahụ.O kwuru sị; “ya bụ ihe bụ eziokwu. E gburu ‘Rev. Fr’. Jude Egbuom nke ‘St Patrick’s Catholic Church Parish’, Amucha n’abali Monde”.
“Ndị omekome ahụ gbukwara onye ọzọ bụ onye nke amatabeghị onye ọ bụ. Ụkọchukwu ahụ ji akwa ụkọchukwu ya oge ha gbagburu ya.”