Otu akpọkuola gọọmentị etiti maka mbize dị n’ Ebonyi, Abia

0
555
Ohaneze Youth Council

NdỊ ndu Ohaneze Ndigbo ụwa nile gbaa gburugburu, ngalaba ndị ntorobịa ‘Ohaneze Youth Council Worldwide’ (OYC) akpokuona ma rịo gọọmentị etiti ka ọ gbata ọsọ enyemaka na mkpamkpa ide mmiri na-akpa na mpaghara ụfọdụ na steeti Ebonyi na Abia.

Ha kwuru sị na ọnọdụ okporoụzọ sitere Abakaliki gaa Ugep, nke dị na steeti Ebonyi, tinyekwara Isikwuato nke steeti Abia, bụzi olulu odum, nke nwere ike ibute ọnwụ n’ebe ndị njem ụgbọala na ndị nile si n’ụzọ ndị ahụ eme njem nọ.

Ha gosipụtara ebumnuche ha site n’aka ndị nta akụkọ n’Abakaliki, isi steeti Ebonyi, site n’aka osote onye isi ha bụ Obinna Achuonye.

Ndị otu a kwuru na ọ bụrụ na e lebaghị ọnọdụ a anya ugbua, na ọ ga-ajọ njọ karịa. Ha kwuru si, “ndị isi Ohaneze Ndigbo, ngalaba ndị ntorobịa n’ụwa nile na-akpọku Gọọmenti Etiti ka ha nye aka n’igbochi mbize n’okporoụzọ Isikwuato na nke sitere Abakaliki gaa Ugep, nke bụzi olulu ọnwụ n’ebe ndị njem ụgbọala nọ.”

Ha gara n’ihu kwuo na obi dị ha mma maka ezi nghọta nke dị n’etiti ha na onye isi ala bụ Buhari, ọkachasi n’ịgba mbọ ịhụ na ndị ‘South East’ ketara oke nke ha.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here