E MEELA ka a mara na ịkpọ ma ọ bụ ịhụta mmadụ dịka òsú n’ala Igbo ga-abịa n’isi njedobe n’ahọ a, ma bụrụkwa nke a ga-amàchi kpamkpam na oge mmemme Ilommụọ Ndị Igbo nke ahọ 2018, bụ nke ga-ewere ọnọdụ n’obi Eze Nri dị n’okpuru ọchịchị Anaọcha dị na steeti Anambra.
Nke a bụ nke e mere ka a mata site n’ọnụ nwa Eze Nrì, ma bụrụkwa onye enyemaka pụrụ iche nke Eze Nri n’ihe gbasara omenala, bụ Maazị Ifeanyị Onyeso, n’okwu ọ gwara ọhanaeze n’aha alaeze Nri. O mere ka a mara na ọ bụ na Nrì, bụ isi ala ndị Igbo, ka ụfọdụ omenala dị iche iche siri wee malite, nke gụnyere ịkwanyere ji ùgwù dịka eze ihe a kụrụ n’ubi, iri ji ọhụụ n’ala Igbo, òsú na ụfọdụ ihe ndị ọzọ ndị Igbo na-agbasò n’ụbọchị taa.
Ọ gara n’ihu kọọ ụfọdụ akụkọ ntọala dị iche iche bànyere etu omenala ụfọdụ siri wee malite n’ala Igbo, ma kwuo na n’ihi oke mkpa ọ dị, na a ga-anọ na mmemme Ilommụọ Ndị Igbo nke ahọ a, bụ nke ga-ewere ọnọdụ n’àbalị iri abụọ na otu nke ọnwa a anyị nọ n’ime ya, n’obi Eze Nri Ènweleána (nke abụọ) Obidịegwu Onyeso, wee malite ịkwụsị ịkpọ ma ọ bụ ịhụta mmadụ dịka òsú n’ala Igbo.
O kwuru na mmemme Ilommụọ ahụ bụ àgbà nke otu puku na iri na iteghete ya, ma bụrụkwa nke a ga-esite na ya wee kwadobe otu nnukwu mmemme ọzọ ka úkwú, bụ nke ga-ewere ọnọdụ n’ọwa Ekeresimeesi ahọ a, ma kpọkuokwa ụmụafọ Igbo niile ka ha nupùta n’ìgwè ma sonye na mmemme ahụ, ọbụnadị dịka o kwere nkwà ịkọrọ ụwa akụkọ banyere etu òsú ahụ siri wee màlite n’ala Igbo n’ezie