MAAZỊ Arinze Awogu, onye isi oche okpuro ọchịchị Ogbaru’ nke Anambra steeti agwala ndị ụlọ ọlụ ‘Enugu Electricity Distribution Company(EEDC) ka ha kwụsị inye ndị mpaghara ahụ ide mmiri na-enye nsogbu ọkụ n’ihi ụjọ ọnwụ ndị mmadu maka ọkụ latrik.
Awogu gwara ndị nta akụkọ n’Awka na ọtụtụ akụrụngwa eji enye ọkụ latrik nke n’alụ ọlụ na mpaghara ahụ bụ nke ewepụsiri n’ihi mmiri na- ezo akwụsi akwụsi.
O kwuru na opekata mpe, na mmadu puku iteghete si na ezinaụlọ otu puku na nari atọ bụ ndị anọghịzi n’ụlọ ha n’Ogbaru.
Awogu kwukwara na e nwere ihe egwu nke nwere ike ibute ihe mmerụ ahụ nyere ahụ ike dịka ọtụtụ ebe nsị na abanye bụrụgworo nke mmiri kwughepụrụ.
Ọ kọwara ọnOdụ ịju mmiri n’Ogbaru dịka nwakpo nke kwesiri ka ewere ọsọ wee za ha site na ndị ‘National’ na Anambra ‘State Emergency Management Agencies’.
“NEMA,SEMA na ndị isi ‘Red Cross’ agaala Ogbaru maka ịhụ ebe ihe ndi a mere,anyị ka na eche nzọpụta ha iji wetuo itufu ndụ na ngwo ngwo e ji ebi n’ụlọ”.
“Anyi ga-aga n’ụlọ ndị mmadụ naani n’ụgbọ n’ihi na mmiri jupụtara ebe nile, ịjụ mmiri a na–abia na abali ma n’ụtụtụ, ndị mmadụ ebido gbaghariwa maka ndụ ha”.