BISHOP ụka Anglikan n’Onitsha, steeti Anambra, Dọkita Owen Nwokolo, adụọla ndị nile bị na akụkụ mmiri ọdụ ka ha kwapụ n’ụlọ ha ma kwaga n’ebe gọọmentị wepụtara ka ha birigodu wee ruo mgbe mmiri ga-akwusị.
O kwuru na ọ bụrụ na ha mee nke a, ọ ga-enye aka belata ọdachị nke ide mmiri n’ala anyị.
Nwokolo kwuru na arịrịọ a bụ n’ihi mkpamkpa ide mmiri kpara n’ala anyị n’oge gara aga, ma rụtụkwa aka otu e si tufuo ndụ ọtụtụ mmadụ ma tinyekwara ngwongwo ndị mmadụ ruru ijeri kwuru ijeri naịra n’ihi ide mmiri.
Ọtụtụ obodo n’Anambra ‘West’ na ndị nọ n’okpuru ọchịchị Ogbaru na steeti ahụ bụ ndị ide mmiri wakporo na nso nso a ebe ha nọ tufuo ọtụtụ ubi na ụlọ.
Onye ụkọchukwu a dụrụ ndị niile bi n’ụdị ebe ahụ ọdụ ka ha nabata ndụmọdụ nke ndị ọkachamara n’ihe gbasara ide mmiri.