Gbapee igwè ọkụ o bunyere ndị ọlụsị n’Anambra
DỊKA e kwuru na ọkwa dị oke elu bụ maka ndi nwere ùgwù na nsọpụrụ, a nọrọ nso a wee guzobe otu nwa amadi e jiri inyere ndị mmadụ aka wee mara, bụ Dọm Okafọr n’ọkwa dịka ‘Patron’ nke òtù ahụ jikọtara ndị nkịtị (laity)n’ala anyị, ngalàbà Dayọsiisi Awka.
Ya bụ mmemme bụ nke imirikiti mmadụ juputara na ya ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ ụbọchị Satọdee gara aga n’ogige ‘Ọkpụnọ Retreat Centre’ dị n’Awka.
N’ajụjụ ọnụ National Light gbara ya banyere ọkwa ahụ pụrụ ichè, ‘Engr.’ Dom, bụkwa onye ji aha otu ndọrọ ndọrọ ‘All Progressive Grand Alliance’ (APGA) were apụta ịzọ ọkwa nnọchi anya ọgbọ nta nkwàdo Agụata n’ụlọ ọgbakọ nnochi anya ala anyị, kọwara na nke ahụ tụrụ ya n’anya n’ezie n’ihi na o nweghịdị mgbe o ji atụ anya ụdị ihe dị etu ahụ, na-agbanyeghị na ya bụ onye na-esonyesi ike ma na-akwàdokwa ihe a na-eme n’ụlọ ụka na n’obodo.
Ọ kọwara ya bụ ọkwa dịka ọkpụkpọ oku iji sị ya rụrụ gaba n’ihu, ọbụnadị dịka ọ gara n’ihu wee kpọpụtasịa ọtụtụ ụzọ dị iche iche ọ mepụtagoro n’obodo na n’ụlọ ụka, nke gụnyere: ịrụgharị na idozigharị ụlọ ụka, idozigharị nnukwu ígwè na-enye ọkụ n’ụlọ ụka ‘St. Patrick’s Cathedral dị n’Igboukwu, ije ozi dịka onyeisi oche òtù bàzáà n’ụlọ ụka ha na n’ụlọ ụka St. Jude Rumokoro dị na Port Harcourt ebe o bì, ịrụgharị ụlọ ozi izugbe dị n’Igboukwu, bụ ‘General Post Office, Igboukwu’, ibunye ndị ụlọ ọrụ
‘Divisional Police Headquarter Igboukwu’ nnukwu ígwè ọhụụ na-enye ọkụ, ibunye ụlọ ahụike dị n’Igboukwu, bụ ‘Obiunọ Health Center, Igboukwu’ nnukwu ígwè na-enye ọkụ, ịkwàdò na ịzụ ọtụtụ ụmụakwụkwọ n’agụmakwụkwọ ha n’ogoogo dị iche iche, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ o mepụtagoro.
Ọ gakwazịrị n’ihu tòó ndị isi òtù ahụ maka ịhụta ya dịka onye kwesiri ekwesi wee nye ya ọkwa ahụ, bụzị nke o kwuru na ọ bụghị naanị na ọ bụ ọkpụkpọ òkù iji sị ya rụrụ gaba n’ihu, kama na o megokwa ya ka ọ bụrụ ihe nlere anya nyere ndị ọzọ, ma bụrụkwa onye a na-eñomi eñomi ma n’ụlọ ụka ma n’obodo n’ihi ọlụ ọma ya na akparamagwa ya.
N’akụkọ dịkwa ka ibe ya, kọmishọna steeti Anambra na-ahụ maka ọdịmma na ihe metụtara ndị nne na ụmụ ntakịrị na steeti Anambra, bụ Oriakụ Ndidi Mezue, nọrọ nso nso a wee gbapee nnukwu ígwè ọhụụ na-enye ọkụ Engr. Dom Okafọr bunyere ògìgè ụlọ ọrụ ebe a na-enye ndị ọlụsị ọzụzụ na steeti Anambra.
Ya bụ nukwu ígwè na-enye ọkụ, bụ nke a rụpụtara site n’aka ụlọ ọrụ ‘JOCARO Nig. Ltd.’, ma bụrụkwa nke íké ya dị KV iri abụọ.
N’okwu ya na mmemme inyefè nnukwu ígwè ọkụ ahụ n’aka ndị ọlụsị, bụ nke weere ọnọdụ n’ogige Ọkammụta Dọra Akụnyịlị ‘Women Development Centre’ dị n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra; ya bụ nwa amadi ọrụ obi ebere na-echu ụra, ma bụrụkwa onyeisi ụlọ ọrụ JOCARO Nig. Ltd. kọwara na ihe kpaliri ya o jiri nye onyinye afọ òfùfò ahụ bụ iji mee ka ihe dịrị ndị ọlụsị nọ n’ogige ahụ amụ ọrụ mfe ma hụkwa na ha na-enwe ọkụ oge niile ha chọrọ, iji wee nyere ha aka n’ihe dị iche iche ha na-eme n’ogige ahụ.
Mmadụ obiọma ahụ, bụkwa onye ji aha otu ndọrọ ndọrọ APGA apụta ịzọ ọkwa nnọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Agụata n’ụlọ ọgbakọ nnọchi anya ala anyị, n’okwu ya, gakwara n’ihu kọọ nkenke akụkọ bànyere etu o siri bàta n’ogige ahụ otu mgbe, bụ ebe a na-akụziri ndị ọlụsị ka e si eme ihe dị iche iche, e wee wèré ọkụ n’ike, nke mezịrị ka ọchịchịrị na ọsụsọ juputa ebe niile n’ihi na ndị ahụ enweghị ígwè na-enye ọkụ ebe ahụ, ya wee kwe ha nkwà ibunye ha ótù n’efu, bụkwazị nke ọ bịara imezuru ha ụbọchị ahụ.
N’okwu nke ya, nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye aka na-achị steeti ahụ n’ihe gbasaara ọlụsị, bụ Maazị Chuks Ezewuzie, onye obi ya juputakwara n’ọñụ, kọwara nke ahụ dịka nke magburu onwe ya nakwa nke kwesiri òtùtó n’ihi na e too onye hụrụ ewu, ọ hụ ehi, o gbuo.
Ọ gara n’ihu kọwaa ụdịrị ihe ọma òtù ahụ bụ ‘Disability And Humanitarian Services Centre’ natagagoro kemgbe e jiri hibe ya n’ahọ 2016 site n’aka osote nwunye aka na-achị steeti ahụ bụ Oriakụ Ebelechukwu Obianọ wee ruo ụbọchị ahụ. O toro ya bụ nwoke obiọma banyere afọ ọma ya, ma kpọkuokwa ndị ọzọ bụ ndị aka ji akụ n’ala anyị ka ha ñomie ụdị akparamagwa ahụ, site n’icheta ndị o nweghị ka ọ ra ha, ndị ọlụsị na ndị ụwa na-atụ n’ọnụ.
Dịka ọ na-agbape igwè ọkụ ahụ, kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ọdịmma na ihe metụtara ndị nne na ụmụ ntàkịrị, bụ Oriakụ Ndidi Mezue, kelere ya bụ agụ nwoke maka obiọma ya na ụlọ ọrụ JOCARO Nig. Ltd.
O tokwara aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka ọrụ ọma ya banyere ndị ọlụsị na steeti ahụ, ọ kachasị site n’ịkpọlite ọtụtụ n’ime ha n’ọkwa ọrụ dị iche iche na steeti ahụ, bụ nke megoro ka ndị mmadụ were ha ghọta na ndị ụlọsị nwere ike n’ezie.
Ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyere ode akwụkwọ ọkpụtọrọkpụ na Minịstịrị na-ahụ maka ọdịmma na ihe metụtara ndị nne na ụmụ ntakịrị, bụ Dọkịta Azụka Ọfọmata; onye enyemaka pụrụ iche nye gọvanọ steeti ahụ n’ihe gbasaara iji ụñàrà (sign) were agwa ndị ọlụsị okwu, bụ Maazị Joseph Collins, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.