ỤKỌCHUKWU ‘St. Jude Thaddeus Catholic Church,’Inoma, nke di na mpaghara Anambra ‘West’ nke Anambra Steeti, Rev. Fr. Charles Chukwukelue Ebele, ka ekwuru na ndụ ya funarịrị ya na ihe mberede ụgbọ mmiri.
Ndi ‘dredger’ nọ n’akuku mmiri kwuru na ụgbọ nke ụkọchukwu a ji eme njem kpuru na mmiri Naija.
Onye hụrụ mgbe ihe mberede a mere bụ Azubuike Okwuoto Imoka,kwuru na enyị ụkọchukwu na ya onwe ya nọkwazi na ụgbọ ahụ mgbe ihe mberede a mere mana n’ihi na ọ nyere enyị ya ‘life jacket’, o wee bụrụ onye na enwetaghị enyemaka mgbe ụgbọ a kpuru.
Ndị ‘Anambra State Emergency Agency'(SEMA),ka agwara maka ihe mberede a dịka ndị isi kwuru na ha ga-eme ihe ọbụla ha ga-eme iji wee bute ozu ya.