OBODO juru nnọọ kpụmkpụm dịka ndị ntorobịa Ọmambala zukọrọ ma nuputakwa n’ịgwè wee merùbe mmemme iri ji ọhụụ ha nke ahọ 2018.
Ya bụ nnukwu mmemme bụ nke weere ọnọdụ n’ogbe Igboezunu Agụleri dị n’okpuru ọchịchị ‘Anambra East’ nke steeti Anambra, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị dị iche iche e ji okwu ha agba izù na steeti ahụ.
N’okwu ya na nnukwu mmemme ahụ dịka ọ na-eme omenala ịwa ji kpọmkwem, onyeisi otu ahụ jikọtara ndị ntorobịa na mpaghara Ọmambala, bụ Maazị Innocent Ọfọdile, mere ka amara a ọ bụ site n’ịgbaso udo na ịdị n’otu ka mmepe si abata n’obodo ọbụla, ma kpọọ òkù ka a gbasoo udo n’ihe ọbụla mmadụ na-eme.
O mere ka a mara na òtù ahụ bụ nke jikọtara ndị ntorobịa niile sitere n’okpuru ọchịchị mejùputara mpaghara Ọmambala, ma kọwaa na e wezuga ịgbaso omenala, na ihe ọzọ bụ isi sekpụ ntị na mmemme ahụ bụ isite na ya wee kwalite ezi mmekọrịta, udo na ịdị n’otu n’etiti obodo niile ahụ dị n’okpuru ọchịchị mejupụtara Ọmambala, nke gụnyere: Ayamelụm, Oyi, ‘Anambra East’ na ‘Anambra West’.
Ya bụ Maazị Ọfọdile, bụkwa nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ n’ihe gbasaara ọrụ nchekwa gakwara n’ihu kpọpụtasịa ihe dị iche iche otu ahụ mepụtagoro, nke gụnyere ịkuziri ndị ntorobịa ihe ha kwesiri ịma, inye ha ndụmọdụ megide akparamagwa dị iche iche na-ebute ala adịghị mma, idozi esemokwu ahụ dapụtara n’etiti Aguleri na Umueri, Ifite Ọgwarị na Ịgbakwụ, Ụmụọba Anam na Agụleri, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ.
N’okwu nke ya, onyeisi nchere oge n’okpuru ọchịchị Anambra West n’oge gara aga, bụ Maazị Tony-Collins Nwabụnwanne, kọwara mmemme ahụ dịka nke magburu onwe ya, tòó ezi mmekọrịta dị n’etiti ndị ntorobịa okpuru ọchịchị niile ahụ, ma kpọọ oku ka a kwàlite nke ahụ iji mee ka o guzosie ike.
Ndị ọzọ sonyere na mmemme ahụ gụnyere nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ Obianọ n’ihe gbasaara ikpokọta ndị ntorobịa bi n’ime ime obodo, bụ Maazị Cyril Okafor, otu onye e ji okwu ya agba izu n’otu ndọrọ ndọrọ APGA, bụ chiifu Emeka Ekwealọr, bụkwa onye sitere Ụmụọba Anam; ode akwụkwọ izugbe nke ndị otu ahụ n’ala anyị, bụ Maazị Uchenna Anizọr, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.