ONYE a na-ele anya na o so n’otu nzuzo, Chinedu Emenike,onye a kpọchiri site na aka ndị ‘Internal Security’ nke ‘Michael Okpara University of Agriculture’ nke di na Umudike, wee kpọnye ya ndị uwe ojii n’Umuahia ‘Area Command’, ekwupụtala na o sonyere otu a mgbe ọ banyere ụlọakwụkwọ mahadum ka o wee nwee ike nweta ọlụ ma ọgụsia akwụkwọ.
Onye ahụ a na-enyo enyo, nke onye kọmishona ndị uwe ojii n’Abia steeti bụ Maazi Anthony Ogbizi kpụgharịrị ma taa ya ụta maka isonye ajọ otu a.
Dịka o si kwuo, nwata nwoke a pụtara na ‘Rivers State Polytechnic’ n’ihi enweghị onye nkwado, mana ọ ka bụkwa onye otu nzuzo nke akpọrọ ‘Aye confraternity’, bụ nke ọ banyere na kampus, ka o wee nyere ya aka ịchọta ọlụ ma ọ bụ ịnwetakwa ọlụ site na aka ndị otu ya ndị ọzọ.