OTU nwata akwụkwọ gbara afọ iri abụọ na abụọ ma nọrọ n’afọ ikpeazụ n’ụlọakwụkwọ ‘Godfrey Okoye University (GOU) Thinkers Corner,’ Enugu, akwụọla ụdọ. Nwata akwụkwọ ahụ,aha ya bụ Desmond Oteh, nọ n’ime ụlọ ya, n’ebe obibi ụmụakwụkwọ kwụọ ụdọ ụbọchị o kwesiri ileghari ule nke ọ dara.
Ụmụakwụkwọ ibe ya chọpụtara nke a n’ihe dịka elekere iri nke ụtụtụ ụbọchị Monde ọnwa Septemba dị na mkpụrụụbọchị iri, ka ha gara ịgwa ya ka ọ gbatulata ụda egwu na-akụ n’ime ụlọ ya.
Otu nwata akwụkwọ ya na onye ahụ nwụrụ anwụ bi n’otu ebe kwuru na ya bụ Desmond nwere nsogbu n’ihi na ọ dịna na ọ chọbuela ịkwụ ụdọ n’oge gara aga nke mere ka a kpọgara ya onye nkuzi na-akụziri ha ihe ọmụmụ ‘psychology’ bụ Gloria Njoku maka ndụmọdụ. Site na nke ahụ ka o jiri kwuo na nsogbu ya bụ oke ịgala ọnụ ụgwọ akwụkwọ, tinyere na ndị ohi zuru ego ọ lụtara n’ọlu mgbe ọ nọ n’ụgbọala.
O kwuru na nke a mere ka ụlọakwụkwọ ahụ nye ya agụmakwụkwọ n’efu ma na’elerukwa ya anya.
Nwa akwụkwọ ọzọ nọ n’afọ nke ikpeazu kwuru si; “kemgbe izuụka abụọ gara aga, Oteh bidoro na-akpa agwa n’ụzọ edochaghị anya. O bidoro na-agara onwe ya.”
Otu osila dị, ndị uweoji steeti Enugu,ngalaba ‘Thinkers Corner’ eburula ozu ya bụ nwata akwụkwọ ma kpọrọkwa ụmụakwụkwọ ise bụ ndị ga-enyere ha aka ime nnyocha.