OTU na-ekwuru ndị onweghị onye na-ekwuru ha, ndị nke a maara dịka ‘Human Diginity Restoration Association (HDRA)’ ekwela nkwa ịhazị ikpe n’efu maka ndị nga mmadụ asaa n’ụlọmkpọrọ dị n’Onitsha na steeti Anambra.
Ndị otu a kwuru na ihe kpalitere ha ime nke a bụ n’ihi ụfọdụ ndị nga bụ ndị a na-atụkpu ma gbahapụ n’enweghị onye ọ bụna na-abịa maka ịgbapụta ha afọ kwuru afọ.
Onye isi otu HDRA n’ala Nigeria bụ Jude Achebe, bụ onye kwupụtara nke a n’Onitsha kwuru na ọ bụ n’ihi arịrịọ otu onye otu ha bụ onye kwuru maka ọnọdụ ndị nga ndị na-enweghị onye ga-ekwuchitere ha n’okwu ha. O kwuru si; “Anyị ewerela ya dịka ihe a ga-eme eme, anyị ewerela mmadụ asaa ebe ndị ọka ikpe anyị na-ekpe ikpe ha n’efu iji hụ na ha nweere onwe ha. Anyị na-eme ihe ekwesịrị ime iji wee hụ na ha nweere onwe ha.”
Ọ kpọrọ aha otu onye n’ime ndị nga ahụ dịka Onyebuchi Onyema, onye nke si steeti Abia, bụ onye nke a tụkpuru n’ihi ohi ịgbawa ụzọ ‘burglary’.
Achebe rụtụrụ aka na oge ikpeazu ya bụ onye nga pụtara n’ụlọikpe bụ n’ọnwa Aprel 2016; ebe Abraham Okeke, onye Obosi, nke dị n’okpuru ọchịchị Idemmiri North na steeti Anambra, bụ onye nke a tụpkuru n’ihi igwu wayo ‘Advanced Fee Fraud (419)’ bịara ikpeazu n’ụlọikpe n’ọnwa Ọgọstụ 2015.