DỊKA ámụmá ahụ e buru na-abịa na mmezu ugbu a, ìjú mmiri awakpòla ma tokpòkwa ụlọ akwụkwọ ‘Federal Poly Oko’, ngalàbà ya nke dị n’Atànị n’okpuru ọchịchị Ọgbarụ nke steeti Anambra.
Ka ọ dị ugbu a, ya bụ ìjú mmiri bụ nke na-etowanyne n’ike n’ike ma na-edebànyesi ebe dị iche iche ụmụakwụkwọ bì na mpaghara na n’ogige ụlọ akwụkwọ ahụ niile, bụzị nke mere ndị isi ụlọ akwụkwọ ahụ jiri mechie ngàlàbà ụlọ akwụkwọ ahụ ozigbo ogigbo ma gwakwa ụmụakwụkwọ niile ka ha lasịsịa ‘nke ta nke echi’ tupuu yaa bụ ìjú mmiri eruo na nke ịgbàgbù mmadụ ma ọ bụ ibute akụkọ ọjọọ karịrị nke o butegoro ebute.
N’ozi ọ kụpụrụ n’ikuku, okwupụta okwu ụlọ akwụkwọ ahụ, bụ maazị Obini Ọnụchukwu, mere ka a mara na ya bụ obere oge ezumike dapụtara mberede ga-adị ruo otu izu ụka, ma ọ bụ karịa, ma ọ bụrụ na ya bụ iju mmiri atakpọghị. O mere ka amara na mmiri ahụ etochiela ebe e si abata ụlọ akwụkwọ ahụ,
ebe a na-enye nkụzi, ime ụlọ ọrụ na ebe ndị ọzọ dị iche iche n’ụlọ akwụkwọ ahụ, bụzị nke mere ka ebe niile tochie ma juputakwa na mmiri, tinyekwuoro mmiri tokpòkwara ụlọ ọkụ na obi ọkụ na-ekesàra ụlọ akwụkwọ ahụ ọkụ, nke mezịrị ka ọchịchịrị gbàchie ebe niile.
Maazị Ọnụchukwu gara n’ihu tòó ịgba mbọ pụrụ ichè nke ụlọ ọrụ ‘National Emergency Maintenance Agency’ (NEMA) and the ‘State Emergency Maintenance Agency’ (SEMA) n’iji belata nsogbu iju mmiri n’ala anyị, ma kpọkuo ha ka ha gbatara ụlọ akwụkwọ ahụ ọsọ enyemaka aka ọkụ aka ọkụ tupuu ihe emebie.
N’ajụjụ ọnụ a gbara ha n’otu n’otu, ụfọdụ n’ime ụmụakwụkwọ na-agụ ebe ahụ, nke gụnyere Chiamaka Obika na Chukwunọnso Ezeh kọwara na ya bụ iju mmiri ebibiela ọtụtụ ihe ha jiri biri, tinyekwuoro akwụkwọ ha na ihe ndị ọzọ, ma kpọkuzie enyemaka gọọmenti na ndị ọzọ ọ dị n’aka ka ha mee ngwa gbatara ha ọsọ enyemaka.