GỌỌMENTỊ Abia steeti ekwuola na ha ekpebiela ịwepụta atụmatụ ịmepe ụlọakụ nke’Small and Medium Enterprise (SME) microfinance’ na onwa a iji kwalite ndị na-azu obere ahia na steeti ahụ.
Maazi Gabriel Igboko,komishona SMEs,kwuru nke a mgbe ndị nta akụkọ gbara ya ajụjụ ọnụ na Umuahia.
Otu a nyere ndị ụlọakwụkwọ akwụkwọ e ji ede ihe,ha kwekwara nkwa ịlụ ebe a na-agụ akwụkwọ bụ ‘library’.
O kwuru na ụlọakụ a bụ otu n’ime ihe mmemme atọ nke ngalaba ọlụ ugbo SME nke gọọmenti steeti ahụ kwadoolu site n’aka ndị ‘Central Bank of Nigeria’.
Kọmishona kọwara na gọọmentị, site n’ọba ego, nyere ngalaba SME ndị ọzọ ego ka ha nwee ike ịgbazite ego bụ nke enweghị ike igbazite na ‘Commercial Banks’.
O kwuru sị, n’ọnwa Okutoba, anyi ga emecha ihe nile anyi kwesịrị ime, iji hụ na emepere ụlọakụ ‘SME microfinance’. Gọvanọ ebinyela aka n’akwụkwọ ma nyekwa nkwado ya ilụ ya bụ ụlọakụ. Anyi a gaala CBN ma anyi ahụla ihe nile ekwesiri ime.
Anyi na-agba mbọ ịchịkọ akwụkwọ ịkike nile.Ha kwuru na ụlọakụ ‘microfinanace’ ga agbazinye opekata mpe ihe dịka naira puku abụọ ma ọ bụ pụkụ ise ma ọ bụ kwa ihe ruru pụkụ naira ise.