GỌVANỌ Imo steeti bụ Rochas Okorocha e kwula na ya ga-etinye ndụ ya na ọbara ya, ịhụ na ya kwere Uche Nwosu n’aka dịka onye gọvanọ na-abata ọhụrụ.
Okorocha kwuru nke a n’ụlọ gọọmenti dị na Imo steeti, ka ana-eme mmemme idu n’iyi ọlụ nke Maazi Mark Uchendu, dịka onye ode akwụkwọ ọhụrụ nke gọọmenti Imo steeti,ndị ode akwụkwọ iteghete nakwa ndị ọzọ site n’aka onye ọlụ ‘Solicitor, Ministry of Justice’, bụ onye nọchịtere anya ‘Attorney General’ nke Imo steeti.
“Taa Uche Nwosu bụ onye isi ndị ọlụ (Chief of staff), ana m ekpe ekpere na otu ụbọchị, aga m ekwe gị n’aka dịka gọvanọ nke Imo steeti.”
“Ọ bụrụ na-anyị eweputaghị Nwosu, anyị emebeghi ịhe kwesịrị ka anyị mee nyere ndị choro nnapụta”.
“Aga m aluzi ụlọakwụkwọ nile na steeti a, a na m emekwara ọtụtụ n’ime unu ebere bụ ndị kwuru na m emebisiela ụzọ nile. Ọ bụ maka mmiri ozuzo mmadu agaghị akọwanwu.
“Ọ ka na agbagwoju m anya ma mmiri a ọ bụ ịhe mmerụ ahụ asiidi.A na m ekwe unu nkwa na-aga ahazi ịhe ndi a nile. Ịhe m na-eme bụ ka m tọọ ntoala nyere gọvanọ ọ bụla ga abata na Imo steeti”.