ỌCHỊCHỊ steeti Anambra eweputala ebe dị iche iche a ga na-anakọ ma ọ bụ na atụkọtakwa ihe dị iche iche maka ndị ahụ ìjú mmiri chụpụrụ na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ.
Nke a bụ nke e mere ka a mara site n’aka kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka mgbasa ozi na ịkọwatara ọhanaeze ihe ha kwesiri ịma, bụ Maazị C-Don Adịnụba, site n’ozi ọ kụpụrụ nso nso a, bụkwa nke gara n’ihu kọwaa na ndị ahụ ìjú mmiri chụpụrụ na be ha chọrọ ọtụtụ ihe enyemaka dị iche iche ugbu a, nke gụnyere ihe oriri na ihe ọñụñụ, àkwà edina, úté, ákwà, ihe e ji esi nri nakwa ọtụtụ ihe enyemaka ndị ọzọ e ji akwàlite ezi ọnọdụ obibi ndụ ndị ahụ.
Dịka ya bụ ozi siri wee kọwaa, ebe ndị ahụ e wepụtara maka ịnakọ ihe ndị ahụ gụnyere: isi ụlọ ọrụ steeti ahụ na-ahụ maka ọnọdụ ntụmadị, bụ ụlọ ọrụ “Anambra State Emergency Management Agency” (SEMA) dị n’Awka, n’okporo ụzọ awara awara ahụ siri Enugu gaa Ọnịsha. Ebe ndị ọzọ bụzị n’isi obodo okpuru ọchịchị Ayamelụm, ‘Anambra East’, ‘Anambra West’, Ọgbaru, ‘Ọnịtsha South’, ‘Ọnịtsha North’, ‘Awka North’ na Ihiala.
Iju mmiri ahụ ka a kọwara na o bibiela ọtụtụ ihe gburu ego dị ijèrì kwuru ìjèrì naịra n’ọtụtụ ebe dị iche iche na steeti ahụ, ma bụrụkwa nke chụpụsịgoro ọtụtụ mmadụ n’ụlọ ha, bibisikwa ọtụtụ ihe a kọrọ n’ugbo. Ọ kpọkuzịrị ndị chọrọ inye aka ka ha wéta ihe enyemaka ha niile n’ebe ndị ahụ e weputara, beere sọ naanị ọgwụ, bụ nke ọ kọwara na a ga-ewega ya na mịnịstịrị na-ahụ maka ahụ ike na steeti ahụ, iji hụ na e leruru ya anya nke ọma ma chekwaba ya etu o kwesiri, site n’aka ndị ọkacha mara.
Maka onye ma ọ bụ ndị chọrọ inye ego, e weputakwara akara ụlọ ọba ego a ga-esi wee kwụnye ya, nke bụ:
Aha: Anambra State Flood Disaster
Ákàrà: 5030091612
Ụlọ Ọba Ego: Fidelity Bank.