Anambra na Enugu ezutela maka ikpezi nsogbu ókè àlà ha

1
1349

N’IHI nsogbu ahụ na-adapụta oge ụfọdụ n’etiti steeti Anmbra na steeti Enugu bànyere ókè àlà, steeti abụọ ahụ ezutela ọzọ iji wee kpezie ma wetakwa ya bụ esemokwu n’isi njedobe.

Nzukọ ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n’obi gọọmenti steeti Enugu, dọtara ụfọdụ ndị e ji okwu ha agba ìzù na steeti abụọ ahụ, tinyere osote aka na-achị steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkem Okeke na osote aka na-achị steeti Enugu bụ Ọkaiwu Cecilia Ezeilo, bụkwa ndị isi oche nke otu na-ahụ maka ihe gbasaara ókè àlà na steeti abụọ ahụ n’otu n’otu.

N’okwu ya n’ọgbakọ ahụ, osote aka na-achị steeti Anambra bụ Dọkịta Nkem Okeke mere ka a mara na òtù ahụ ná-ahụ maka ihe gbasaara ókè ala n’ala anyị, bụ ‘National Boundary Commission’ anaghị àkpá oke àlà iji wee bute ọgba aghara, kama na ọ bụ iji kwàlite mmepe na udo tọrọ àtọ n’etiti obodo na ibè ya. Ọ gara n’ihu kọwaa oke mkpà nzukọ ahụ dị n’ihi nsogbu dị iche iche ịzọ ókè ala ahụ wètagòrò, ma gosipụta ezi olile anya o nwere na mkparịta ụbụbọ ahụ ga-eweta ùdó tọrọ àtọ nyere ọnọdụ ahụ.

Na ntụnye nke ya, òsótè aka na-achị steeti Enugu, bụ Oriakụ Cecilia Ezeilo, tòrò ndị obodo abụọ ahụ maka nnagide ha n’ọnọdụ ịzọ ya bụ oke ala. O kelekwara ndị dị iche iche na òtù sonyere n’ọgbakọ ahụ n’ihi ịgba mbọ esepughị aka nke ha na-agba iji wee kpáá ya bụ oke ala ma wetakwa nsogbu ahụ n’isi njedobe.

N’okwu dịkwa ka ibe ya, onyeisi oche òtù na-ahụ maka ihe gbasaara ịkpa ókè àlà n’ala Nigeria, bụ Maazị Mọhammed Ahmed, nke onye nọchitere anya ya bụ Maazị Adamu Adaji kọwara na a gbaala ọtụtụ mbọ iji weta nsogbu ókè àlà n’etiti steeti abụọ ahụ n’isi njedobe, ma kwuo na ya bụ ókè àlà ha bụ ụlọ ọrụ jigoro aka ha wee kpáá ugbu a ga-eme ka a kwụsị ịnụ ihe banyere nsogbu oke àlà n’etiti steeti abụọ ahụ, ma wètakwara ha udo ga-adị ọkpụtọrọkpụ.

GUO:  E nyela ndị nkuzi Anambra ọzụzụ iji usoro ICT akwalite mmụta n'Awka

A nọkwazịrị na mmemme ahụ kesàá akwụkwọ bànyere mkparịta ụbụbọ na nkwekọrịta dị iche iche e nwere na nzùkọ ahụ n’etiti steeti abụọ ahụ.

1 ikwu

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here