ỤBỌCHỊ ụka gara aga bụ oke ụbọchị n’ụlọụka ‘St Gabriel’s Parish’ Okpuno, nke dị n’okpuru ọchịchị Awka ‘South’ na steeti Anambra. Ha nọrọ ụbọchị ahụ hibe otu ụmụaka ‘Holy Childhood Association’.
Ụkọchukwu Fidelis Izuakor, bụ onye nlekọta otu ahụ na dinarị I Awka ma bụrụkwa ụkọchukwu na-alụ ọlụ n’ụlọụka ahụ nọrọ n’isi emume n’aja maasị dị asọ nke kpọkụlọtara ọtụtụ ndị mmadụ n’ụlọụka ahụ nke gụnyere ‘Rev Sr’ Makuochukwu Okafor, bụ onye na-ahụ maka otu ahụ na dayọsis Awka.
N’okwuchukwu, ‘Fr’ Izuako gwara ụmụaka ka ha na-erube isi dịka Samuel n’akwụkwọ nsọ nke bụ ihe ọgụgụ izizi a gụrụ.
Ọ dụkwara ndị nne na nna ọdụ ka ha gbaa mbọ ịzụ ụmụ ha nke ọma ma rụtụrụ ha aka etu Chineke si taa Eli ahụhụ n’ihi na ọ lụghị ọlụ ya nke ọma dịka nna n’ebe ụmụ ya nọ; ma gwakwa ha ka ha hapụ ị na-eduhie ụmụ ha ụzọ.
Ọ gakwara n’ihu kwuo sị, “otu a ‘Holy Childhood Association’ malitere na mba France otu narị afọ na iri asaa na ise gara aga, ka ụmụaka wee na-enyere ụmụaka ibe ha aka, ka anyị kwado ha. Nwata ọbụna si otu a wee too ga-aba uru n’ọdịnihi.”
N’okwu nke ya, onye na-ahụ maka otu a na dayọsis Awka bụ ‘Rev Sr’ Makuochukwu Okafor, gwara ụmụaka ahụ sị, “nwebenu añụrị n’ihi na taa bụ ụbọchị unu. Obi dị m ụtọ na unu nwere ọtụtụ ndị nchịkwa.”
‘Sr’ Okafor rịokwara ụmụaka ndị ọzọ ka ha sonyere otu ahụ ma rịọkwaa ndị nne na nna, tinyere ndị na-achikwa ụmụaka ahụ ka ha nyere ha aka iguzosi ike.
A nọ n’ime ụka ahụ nabata ụmụaka ahụ ma nyekwa ha ihe ha ga-eji na-etinye ego nke ha ga-eji ha na-enyere ụmụaka ndị ọzọ aka.
Elizabeth Ilonwa, otu onye n’ime ndị na-akụziri ụmụaka ahụ kelere Chineke maka nnukwu ụbọchị ahụ ma kwukwaa na otu ahụ zuru ụwa nile. O kwuru na ya bụ otu ụmụaka e hibere na parish ahụ e meela ka ha zuo oke dịka ha dịbu na mbụ.
Maazị Charles Nwuba, bụ ‘Cathechist’ nke ụlọụka ahụ kwuru na otu ọ bụ na otu ahụ gbara ndị mbụ na dinarị ụbọchị ahụ e hibere ya dịka ‘Sr’ Okafor si kwuo, na nke a gosiri na ụtụrụkpa ga-amizi ojoroko n’ọdịnihu.
N’akụkụ nke ya, Dọkịnta Nkechi Okoye, otu onye na ndị na-ahazị mmemme ahụ kwuru si; “nke a bụ nrọ ipụta ihe. Emume a dị ngalaba atọ”. Ọ gara n’ihu kwuo na ha na-echetakwa ụbọchị onye nsọ nke ụlọụka ahụ bụ ‘St Gabriel’.
Otu onye n’ime ụmụaka a nabatara n’otu ahụ, Gloria Chukwuedozie, n’aha ụmụaka ndị ọzọ, kwuru na obi bụ ya so añụrị n’ihi ụbọchị ahụ ma kelekwaa Chineke maka ihe nile.
Ka agbasara ụka, a nọrọ na-mbara ụlọụka wee mee nnukwu oriri na ọñụñụ ebe ndị mmadụ juru wee lere anya n’ihe ngosi dị iche iche.
Ụkọchukwu St Gabriel Parish bụ ‘Rev Fr’ Anthony Nwofor nọ na ya nabata ndị mmadụ, o kelere Chineke onye ji ike nile ma gọọkwa ọfọ ọma maka emume ahụ na maka ọdị mma ndị mmadụ.
Ihe ngosi e mere gụnyere ukwe nnabata, ejije, ejiji, wdg.