DỊKA ala Nigeria mere mmemme icheta na o nwerela onwe ya, ya bụ oke mmemme bụ nnọọ nke kporo ọkụ ma gakwa siriri werere n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra.
Nnukwu mmemme ahụ bụkwa nke a nọrọ na ya wee mee ncheta ọgbụgba ahọ iri ise na asatọ nke ala Nigeria, ma bụrụkwa nke dọtara ndị dị iche iche e ji okwu ha agba ìzù na steeti ahụ na mpụga ya, nke gụnyere ndị ọchịchị, ndị ụlọ ọgbakọ omebe iwu, ndị isi ụka, ndị eze ọdịnala, ụmụ akwụkwọ, tinyere ndị ọrụ uwe dị iche iche n’ala anyị.
N’okwu ya na mmemme ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n’ama egwuregwu Alex Ekwueme, aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ kọwara mmemme ahụ dịka oge kwesiri iji tụgharịa uche n’ọnọdụ ala Nigeria, ihe dị iche iche na-eme n’ime ya oge ugbu a na nhọpụta izugbe ahụ a ga-eme n’ala anyị n’ahọ 2019.
O mere ka a mara na ala Nigeria agabigala ọtụtụ ihe, ma ka na-agabigakwa ruo ugbu a, ma sị na ụfọdụ ihe ndị ahụ bụkwa nnọọ nke ụfọdụ mbà ndị ọzọ dị iche iche gabìgàgòrò, ọ bụnadị dịka o kwuputara ezi olile anya o nwere na ala Nigeria ga-adịrịrị mma otu ụbọchị.
Gọvanọ Obianọ gara n’ihu kpọpụtasịa ụfọdụ ụzọ dị iche iche ọchịchị ya sigoro gosipụta ihe ọchịchị onye kwuo uche ya bụ na steeti ahụ site n’inye ụmụ mmadụ ọnụ okwu, ịkwàlite mmepe nakwa ime ka ọnọdụ dịrị ụmụ mmadụ mma; ma kpọkuzie ndị dị iche iche ji ọkwa ọchịchị n’ala anyị ka ha biko tụgharịa uche,
ghọta ebumnobi e jiri gùzobe ha n’ọkwa ahụ, ma buru ụzọ chọọ ọdịmma nke ala anyị n’izugbe tupuu ha achọba ọdịmma nke ọnwe ha. Ọ dụzịkwara ụmụafọ ala Nigeria na imirikiti ndị bịara mmemme ahụ ka anya saa ha niile n’ihe gbasaara nhọpụta izugbe ahụ a ga-eme n’ala anyị iji hụ na ha tụnyeere onye kwesiri ekwesi na onye nwere ihe ọ ga-ewe iji dozie ọnọdụ akụnụba ala anyị.
N’okwu nke ha n’otu n’otu, ode akwụkwọ izugbe nke steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelụ, kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ọrụ, bụ Maazị Marcel Ifejiọfọr, na onyeisi ndị ọrụ nyere Gọvanọ Obianọ, bụ Maazị Primus Ọdịlị,
metụrụ aka n’ihe gbasaara ọnọdụ ala anyị ugbu a, na ọtụtụ ihe dị iche iche na-emegasịzị na ya na ihe a tụrụ anya n’aka ala anyị ugbu a dịka ọ na-agba ahọ iri ise na asatọ, ma kpọọ òkù ka onye ọbụla bụ ezi nwaafọ Nigeria na ndị ji ọkwa ọchịchị dị iche iche n’ala anyị tụnye ụtụ nke ya n’ụzọ a tụrụ anya iji weta mgbanwe na ezi ọnọdụ a tụrụ anya n’ala anyị ugbu a.
A nọrọ na mmemme ahụ mee asọmpi ịkwụ na ahịrị na ife aka, gbaa egwu ọdịnala nakwa ụfọdụ ihe egwuregwu ndị ọzọ e megasịrị, bụzị nke mere ka ya mmemme bụrụ ụwa bịa lèé.