ỊGBA alukwaghịm bụ ihe na-adapụta na ndụ. N’ebe di na nwunye nọ, nwoke nwere ike ịgba nwanyị alụkwaghị m, nwanyị nwekwara ike ịgba nwoke alụkwaghị m. A na-eme nke a ma ọ bụrụ na ọ kwekaghị di na nwunye omume.
N’oge mbụ, o nwere usoro e si eme ya, nke a mere na ọ bụghị ihe na adapụta mgbe ọbụna. Mana n’oge ugbua, ịgba alụkwaghị m di na nwunye tọpụrụ ogọdọ gbara ọtọ. Nke bụzi ma n’ụzọ omenala Igbo, ma n’ụlọ ụka, tinyekwara ụlọ ikpe, alụkwaghị m na-arị ibe ya elu. Ihe na-ewuzi n’ọhịa na ụzọ bụ a lụọ taa, a gbasaa echi.
Otu onye ụkọchukwu, mgbe ọ na-akụzi nkuzi nke okwukwe n’ụlọụka kwuru na ihe na-akpata mgbasa di na nwunye bụ elerughị anya tupu abanye n’alụm di. O kwuru na ọ na-adị ndị mmadụ ọsọ ọsọ ịbanye n’alum di ebe ha amaghị na ọbụghị ihe e ji ọsọ abanye. O nyere ọmụmaatụ otu nwokorobia si chọọ ịlụ nwanyị, ka ọ gwachara onye ahụ na ọ chọrọ ịlụ ya, ọ hụkwa nwanne nwanyị ahụ nke obere, hapụzịa onye nke mbụ, lụbazịa nke obere ahụ. Ọ karịghị otu afọ, ha gbasaa, o fochaa ha n’anya.
Ọ dụkwara ndị nne na nna ọdụ ka uche ha dị ya, ka ha na-eleru anya wee mara ihe ha na-eme.
Oriaku Adaku Okeke kwuru na enweghị aka ọlụ so akpata mgbasa di na nwunye. O kwuru na otu ọtụtụ ụmụ nwoke enweghị ọlụ si abanye n’alum di adịghị mma. Ọ kọwara na nwoke kwesiri inwe ihe ọ na-alụ tupu ọ kpọbata nwanyị n’ụlọ. O kwuru na nke a na-emebi ihe n’ihi na ego anaghị ada n’elu. Ọ dụkwara ndụmọdụ ka nwanyị nwee aka ọlụ tupu ọ lụba di ka ibu wee dịrị nwoke mfe. Dịka o siri kwu; “wete wete na-ebute esemokwu n’ihi na bête suya bête suya bụ n’ahụ nama”.
Izunna Okafor,kwuru na ihe na-ebutekari mgbasa di na nwunye bụ na ọ bụrụ na nwoke adịghị ike dịka nwoke. Nke a pụtara na ọ bụrụ na nwoke anaghị enye nwunye ya ihe ọ chọrọ, otu o kwesiri na mmekọ di na nwunye. O kwuru sị na ọ bụ nke ahụ bụ isi sekpu ntị n’alum di. O kwukwara na otu ahụ ka ọ dị n’ebe nwanyị nọ, ọ bụrụ na ọ naghị ahapụrụ di ya onwe ya dịka di ya si chọọ, na di ya nwekwara ike ịgba ya alụkwaghị m n’ihi na ọ bụ nke ahụ bụ ihe mbụ o ji bịawa ije di.
Onyinye Ike kwuru na ọnọdụ nne di na nwunye nwa so n’ihe ọzọ na-ebute nsogbu n’ebe di na nwunye nọ. O kwuru na ụfọdụ ndị nne di na-adị njọ si n’ụzọ dị otu a kewaa di na nwunye; ebe ụfọdụ nsogbu na-esikwa ụfọdụ nwunye nwa n’aka. Mgbe ọ dị otu a, ihe ọzọ na-eso ya bụ di na nwunye ịgba onwe ha alụkwaghị m n’ihi na udo anaghị adị ebe ọgba aghara dị. Ọ dụrụ ụmụnwoke ọdụ ka ha leruo anya n’oge mgbe ọ dị otu a. Ọ bụrụ na ha chọpụta onye nsogbu si n’aka; ha emee udo ozigbo ka mmiri ghara ịba gari. Ọ bụrụ na ha emeghị ya, ekete ga-ekwupu ike, kpọrọkpọtọ e wee gbaa n’ihu ehi.
Mazị Udoye kwuru si na mgbasa di na nwunye na-esi ụmụnwoke n’aka n’ihi na ọtụtụ n’ime ha anaghị eleru anya nke ọma tupu ha alụba nwanyị. O kwuru sị, “ụfọdụ ụmụnwoke na-achụ nwanyị ka mkpi. Ebe ọbụna ha hụrụ nwanyị, ma n’ụzọ waya, ma n’ọhịa ma n’ahịa, ha esoro ya etu mkpi si eso ewu ha alụba di na nwunye, nwanne echi, ha agbasaa. Ọ bụ onye ka ikpe mara? Nwoke!
“N’oge gboo, mgbe m lụrụ nwanyị, a na-achọ nwanyị achọ. Nwoke na-achọ nwanyị otu afọ, afọ abụọ, afọ atọ ma ọ bụ karịa. Mgbe ọbụna o ji chọta nwanyị, ọ lụọ ya, laba be ya zuru ike n’ihi na ọ gaghị enwe nsogbu ọbụna.Ụmụaka ugbua na-eme ọ chaa achaa, gbute, ọ chaghị acha, gbute. Ọ bụ nke a debere ha isi aja aja.”
Ọtụtụ ndị mmadụ kwukwara na amụtaghị nwa nwoke sokwa n’ihe na-ebute mgbasa n’ebe di na nwunye nọ, tinyekwara amụtaghị nwa ncha ncha. Ha kwuru na ọ bụ n’ihi ịmụta nwa ka ndị Igbo ji alụ di na nwunye, ka ama ha ghara ichi nke mere ha jị aza aha dịka: Ahamefuna, Obiefuna, Somadina, Obiechina, Amaefuna w.d.g.
Ha kwuru si; ezinaụlọ ụfọdụ hụtara onwe ha n’ụdị ọnọdụ a, ọbụrụ na amaghị ihe emere ya, ha na-agbasa.
Ndị ọzọ tunyere ụtụ ọnụ nke ha site n’ikwu na ajọ agwa na-eso ebute mgbasa di na nwunye. Ajọ agwa ndị a gụnyere nwoke ịñụbiga mmanya oke, iti nwanyị ihe, tinyere nwanyị ịgba n’ezi. Ha kwuru na mgbe ihe ndị a na-eme, ọ ga-ebute nsogbu nke ga-akpọbata ndị asiri n’ezinaụlọ ahụ. Mgbe ndị asịrị batara, okwu agwụ; di na nwunye ahụ ga-agbasa.