NNUKWU ọñụ juru nnọọ n’obodo Awà, dị n’okpuru ọchịchị Orumba ‘North’ nke steeti Anambra ka ndị obodo ahụ nuputara n’ìgwè wee merùbe mmemme Otute Awanigbo nke ahọ 2018. Nke ahụ bụ otu n’ime oke mmemme e jiri mara mba ahụ.
Nnukwu mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’obi Oloowu ndị obodo ahụ, bụ Mazị Israel Ezue.
Nnukwu mmemme ahụ dọtara ọtụtụ ndị mmadụ selitere isi na steeti ahụ, ma bụrụ nke a nọrọ na ya wee nyekwa ọtụtụ ndị mmadụ, ọ kachasị ndị ntorobịa ruru iri na asaa ihe nkwàdo dị iche iche, nke gụnyere ụgbọala e ji ebu ndị njem, ihe ọnyịnya Keke Na Pep, nnukwu ụgbọala e ji ebu ájä, na ụfọdụ ihe ndị ọzọ, bụ nke e mere site n’aka ya bụ Oloowu obodo ahụ, n’okpuru òtù enyemaka ya, bụ “Chief Israel Ezue Foundation”.
N’okwu ya dịka ọ na-enyefe ha ihe nkwàdo ndị ahụ, Chiifu Ezue kọwara nke ahụ dịka otu n’ime ụzọ o si atụnye ụtụ nke ya n’ịkwàlite ụmụ mmadụ, ime ka ndị ntorobịa nwee ihe ha na-eme, na ibèlàtà nsogbu enweghị ọrụ n’ala anyị.
Na ntụnye nke ya dịka ọ na-ekpe ekpere maka ihe nkwàdó ndị ahụ, Bishpoọpụ enyemaka nke Dayọsiisi Awka, bụ ‘Most Reverend’ Jonas Benson Okoye, tòrò ya bụ nwa amadi mere ihe ahụ n’ihi ọtụtụ ịgba mbọ dị iche iche ọ na-agba n’ịkwàlite olile anya, ọrụ aka na ọnọdụ obibi ndụ ụmụ mmadụ, ma kpọkukwazie ndị ọzọ bụ ndị aka ji akụ na ndị nwere ótù ihe ma ọ bụ nke ọzọ, ka ha ñòmie akparamagwa nwoke ọma ahụ site n’inyerịtara ụmụ mmadụ aka, ka ha wee nweta ngozị ahụ Chineke n’onwe ya kwàdòòrò ndị na-enye enye.
A nọrọ na ya bụ oke mmemme wee waa ma rie ji ọhụụ kpọnkwem, bụ isi sekpụ ntị n’ihe a bịara ime ụbọchị ahụ, ma gbaakwa egwu mmọnwụ na egwu ọdịnala dị iche iche, bụ nke mere ka ebubè jupụta na ya.
Ọtụtụ ndị ọzọ sonyere na mmemme ahụ gụnyere: nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ Obianọ n’ihe gbàsaara mmekọrịta ya na ime-ime obodo, bụ Maazị Chukwuemeka Egwuọnwụ, eze ọdịnala ndị Nanka, bụ Igwe Godwin Ezeilo, eze ọdịnala Ufuma, bụ Igwe Silvester Ucheime, nke obodo Ọffọr-Mberedeọgụ nke Enugu-Inyi, dị na mpaghara Oji River nke steeti Enugu, tinyere onyeisi ọchịchị òbòdò Awà, bụ Ọkammụta Sunday Obikeze, na ọtụtụ ndị ọzọ, bụ ndị kọwara ya bụ ọgbakọ dịka nke magburu onwe ya ma kpọkwa òkù ka a kwàlite njirimara na omenala ndị Igbo oge ọbụla ka ha ghara ifù ma ọ bụ nwụọ n’aka anyị.