Ndị eze akpọọla oku maka ịkwụsị osu na steeti Imo

0
624
Ohaneze

NDỊ eze ọdịnala na steeti Imo akpọọla oku maka ịkwụsi osu kpamkpam. Ha kwuru sị na ya bụ ihe nke dị kemgbe n’ala Igbo bụ mmegide nyere mmadụ, ma kwuo na ọ na-eweta nkewpaụ.

Ndị eze iri abụọ na anọ n’okpuru ọchịchị Oguta, na steeti Imo, ebinyela aka ịkwụsị ihe a kpọrọ osu iji wee zọpụta ndị nke a metụtara site na mkpachapụ.

Ya bụ ihe nke dịbara gboo gboo bụ nke a maara n’ọtụtụ akụkụ ala Igbo dịka osu, ohu, ume, ebe a na-ewe ụfọdụ na ọ bụ ndị mmadụ ma ọ bụ alụsị nwe ha.

Ndị eze ọdịnala ahụ kwuru na nke a ebutela nkewa na mmegide, ma n’alumdi.

GUO:  ‘A ga-amàchi ịhụta mmadụ dịka òsú n’ala Igbo n'afọ a’

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here