Ụmụawụlụ ewere ọñụ rie ji ọhụụ

0
661
Ụmụawụlụ

DỊKA a sị na omenala bụ ọdịbendị, ndị obodo Ụmụawụlụ dị n’okpuru ọchịchị Awka Sawụtụ na steeti Anambra ewerela oke ọñụ na èkèlé rie ji ọhụụ ha nke ahọ 2018.

Ya bụ mmemme bụ nke weere ọnọdụ n’obi eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Joel Egwuọnwụ, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị dị iche iche selitere isi na ngalaba dị iche iche na steeti ahụ, malite na ndị ji ọkwa gọọmenti, ruo na ndị na-azụ ahịa, ndị eze ọdịnala na imirikiti mmadụ ndị ọzọ sitere n’ime na na mpụgá steeti ahụ.

N’okwu ya na mmemme ahụ, otu nnukwu onye ọbịa pụrụ iche, ma bụrụkwa aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, nke ọnye nọchitere anya ya bụ nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nyere ya n’ihe gbasaara echichi ọdịnala na ọchịchị ime-ime obodo, bụ Oriakụ Vera Okonkwọ tòró eze ọdịnala obodo ahụ maka ezi odúdú ya n’obodo ahụ na mbọ ya ịchekwaba na ịkwalite njirimara na omenala ndị Igbo, ma kwe nkwà na ọchịchị ya kwụ ya n’azụ n’inye ya nkwàdo zuru òkè.

Na mbụ n’okwu ya dịka ọ na-eme omenala ịwa ji kpọnkwem, Igwe Egwuọnwụ tòrò Chukwu Abịama maka udo, ngọzị na ndụ o nyere ndị obodo ahụ site n’ime ka ha kọọ ma gwute ji, ma kpekwazie ekpere maka udo tọrọ atọ, ọganihu, ogologo ndụ na ahụ ike nke ndị Ụmụawụlụ, ndị Anambra na àlà Nigeria n’izugbe.

N’okwu ha n’otu n’otu na mmemme ahụ, nwa amadi na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Anambra etiti n’ụlọ ọgbakọ omebe iwu ala anyị, bụ Maazị Victor Umeh, na osote okwupụta okwu ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti Anambra, bụ Maazị Harford Oseke, bụkwa nwaafọ obodo ahụ, tòrò Igwe Egwuọnwụ, bụ onye ha kọwara dịka ezi onye ndu nke udo na ìhè malitegoro ịbata n’obodo ya kemgbe o batara n’oche eze. Ha kpọkuzịkwara ya ka o jide ka o ji, ọ bụnadị dịka ha kwere nkwà inye ya nkwàdo iji gaa n’ihu n’ezi ọchịchị o ji n’aka n’obodo ahụ.

A nọrọ na mmemme ahụ wee nye mmadụ atọ ndị ọrụ ugbo n’obodo ahụ ihe nrita, bụ ndị ji ha kachara wee buo ibù n’ahọ a. A nọkwara na ya gbaa ọgwụ mgbòchi ọrịa maka ụmụaka nọ n’agbata ahọ éfù wee ruo n’agbata ahọ ise, gbaa egwu ọdịnala dị iche iche, mee emume oriri na ọñụñụ ma gosipụtakwa ịma mma nke ọnatarachi na omenala ndị Igbo n’ùjú ya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here