A TỤỌLA otu nwoke ji ọgbatumtum akpa ihe ọ na-eri (ọkada) nga afọ iri na anọ maka ịtụba nwa ya nwanyị dị afọ iri na atọ ime.
Nwoke ahụ bụ Friday Moses, ka a tụrụ nga, tinyekwara na ọ ga na-alụ ọlụ ike na ya. E nyeghị ya ohere iji ego wee gbara onwe ya n’ihi ya bụ arụ o mere site n’idakpo ma tụba nwa ọ mụrụ amụ ime.
Majie kpere ikpe ahụ bụ Chief Magistrate J.O Ejale n’ụlọ ikpe Evbuoriaria ‘Magistrate Court Benin City na steeti Edo. Moses, onye nke a tụrụ nga gbara afọ iri anọ na abụọ ma bụrụ onye Cross River bị n’Edo. A kpọtara ya ụlọikpe maka ịdakpo nwa ya nwanyị kemgbe afọ ise gara aga nne nwa ahụ nwụrụ.
Majie ahụ kwuru na nga a tụrụ Moses bụ iji wee kuziere ya ihe tinyekwara ndị ọdị ka ọ dị ya ndị ọzọ.
Nwata nwanyị ahụ bụ nwa akwụkwọ ‘primary’ nke isii, bụ onye dị ime ọnwa ise na izuụka abụọ ugbua. Nne na nna ha mụtara ha atọ, ya bụ nke izizi.
Ka ọ dị ugbua, ọ nọzị n’aka nchekwa nke ngalaba na-ahụ maka ọdị mma ụmụnwanyị ‘Ministry of Women Affairs and Social Development’ maka ileta ya anya nke ọma.