AKỤKỌ e siri mba offesi nweta na-akọwa na agụ adọgbuola otu onye na-alụ ọlụ n’ụlọ ebe a na-azụ ụmụanụmanụ (zoo) nke dị na Southern Japan.
Onye uweoji gwara ndị nta akụkọ sị, “onye nlekọta ụmụanụmanụ n’ebe a na-azụ ha ka a hụrụ ka ọ tọgbọrọ n’ime ọgba (cage) na-agba ọbara.” Ọ gakwara n’ihu kwuo na-ebugara nwoke ahụ ụlọọgwụ ebe a nọrọ kọwaa na ọ bulaala akwụkwọ nke pụtara na ọ nwụọla.
Akira Furusho, bụ onye ahụ nwụrụ anwụ nke gbara afọ iri anọ, bụ onye achọpụtara na ọ na-agba ọbara n’olu