
N’IMEZUPỤTA ezi ebumnobi ya nyégárá ndị ntorobịa na steeti ahụ, ọchịchị steeti Anambra agbapeela atụmatụ ‘ótù onye ntorobịa, ótù ọlụ aka’, bụ atụmatụ gbakwàsàrà ụkwụ n’imezupụta ezi ebumnobi nke aka na-achị ya bụ steeti, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, na nkwa ahụ o kwere ịzụpụta ndị ntorobịa dị púkú iri n’ọnụ ọgụgụ na steeti ahụ, kwà afọ ọbụla.
Mmepe ịgbape atụmatụ a bụ nke e mere ụbọchị Tuzdee n’ogige ụlọ ọrụ minịstịrị na-ahụ maka nkwàlitè ndị ntorobịa na akụnụba nke ihe e ji aka emepụta, dị n’Awka, bụ isi obodo steeti ahụ.
N’okwu ya na mmemme ahụ, aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ osote ya, Dọkịta Nkem Okeke, kọwara atụmatụ ahụ dịka nke magburu onwe ya na nke bịara n’oge ya, ọ kachasị n’ihi nsogbu enweghị ọrụ ahụ dị n’ala Nigeria ugbu a.
O kwupụtara ezi olile anya o nwere na site n’ụdị atụmatụ dị otu ahụ, na a gà-ebelata ya bụ nsogbu, mee ka ndị ntorobịa bụrụ ndị kwụụrụ onwe ha, ma kpọkùkwazie ndị ntorobịa ndị ga-eso rita úrù na ya bụ atụmatụ ka ha tinye úchü n’ihe ọmụmụ ahụ iji baara onwe ha na obodo ha urù, ma nwekwa ike nyere ndị ọzọ aka.
N’okwu nke ya, Kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka nkwàlitè ndị ntorobịa na akụnụba nke ihe e ji aka emepụta, bụ Maazị Bonaveture Enemali, mere ka a mara na inye ndị ntorobịa nkwàdo bụ nnọọ ụzọ pụtakarịchara ìhè a pụrụ isi gbòó nsogbu enweghị ọrụ, ma bèlatakwa nsogbu e nweghị nchekwa na nsogbu ndị ọzọ dị iche iche na-esite n’aka ndị ntorobịa apụta.
Ọ kpọpụtasịkwara ọtụtụ ihe dị iche iche Gọvanọ Obianọ mepụtagoro n’ebe o metụtara ịkwàlite ndị ntotorobịa steeti ahụ na ime ka ha nweta ezi ohere na ọnọdụ dị làrịị iji bàárá onwe ha úrù, ọ kachasị n’ebe o metụtara ọrụ ugbo, ọrụ aka na ihe ndị ọzọ.

Onye ọzọ kwukwara okwu na mmemme ahụ ma bụrụkwa onyeisi ụlọ ọrụ ‘Anambra Small Business Agency’ (ASBA), bụ Maazị Clement Chukwuka, kpọkùrù ndị ntorobịa ahụ ka ha gbasie mbọ ike mee nke ọma n’ihe nkụzi ahụ a ga-enye ha.
O kwukwara na ụlọ ọlụ ASBA na-agbalịsi ike inye mgbazinye ego maka nkwalite azụmahịa na ọrụ aka, ma kpọkukwa ndị ntorobịa steeti ahụ ka ha were ohere ahụ kpọrọ ihe.
Atụmatụ a bụ nke e kwuru na a ga-eji mmadụ narị atọ na iri ise wèé màlite, ma bụrụkwa nke ga-adị ruo izu ụka atọ, ebe ndị ntorobịa ahụ a họọrọ ga-enweta ọzụzụ n’ọlụ aka dị iche iche.
Atụmatụ a bụ n’imezupụta nkwà ahụ Gọvanọ Willie Obianọ kwere n’ọnwa Ọgọọstụ afọ a, mgbe e merubere mmemme ụbọchị ndị ntorobịa n’ụwa gbaa gburu, bụ nke ọ nọrọ na ya wee kwuo na ọ ga-azụpụta ndị ntorobịa puku iri na steeti ahụ kwà afọ ọbụla ma meekwa ka ha guzoro onwe ha.