NA ‘University of Port Harcourt Teaching Hospital’ (UPTH), onye na-elekọta ebe a na-echekwa ozu abụrụla onye a na-atụ aka na ọ wepụrụ anya nwata nwụrụ anwụ, bụ ejima dị ọnwa iri na asatọ a kpọrọ Chuma,onye ọria akpọrọ ‘Anaemia’ gburu n’ụlọọgwụ ebe ụmụaka na-anọ n’ọnwa Ọgọọstụ na mkpụrụ ụbọchị atọ n’afọ 2018.
Nna nwa a nwụrụ anwụ, bụ onye gaghachiri ịkwụ ụgwọ ebe ana etinye ozu ka ịzụ ụka abụọ gachaara, chọpụtara na ozu ha butere ya abụlụgo ihe ewepụrụ ihe na ya, ma ndị na-ahụ maka ịchekwa ozu na UPTH enweghị ike inye aziza banyere etu, mgbe ma ọ bụ ihe kpatara ụfọdụ ahụ ya ji bụrụ nke a na-achọ-achọ.
Nna nwa a nwụrụ anwụ, na nkọwa ya, kwuru na, “mgbe nwa a ka na-eku ume, otu nwanyi nọọsụ bịakwutere m gwa m ka m kwụọ puku naira atọ iji lie nwa ahụ ebe ọzọ. Nke a mere ka iwe wee m. Site n’oge ahụ, ha bidoro mewe omume na-egosi na ọgbasaghị ha wee dobe ahụ na ha na-eche ọbara rue mgbe nwa a nwụrụ”.
E kwuru na di na nwunye a emeela njem gaa Ugheli, ebe ndị ezinaụlọ ha gbara ha ume ka ha bulata ozu ya ụlọ maka olili ya.
“Agara m n’ebe a na-etinye ozu na ọnwa Septemba, na mkpụrụ ụbọchị iri na asaa, ịkwụ ụgwọ wee buru ozu ya. E nwere m puku naịra iri abụọ ebe a. Ka ha nachaara m ego ahụ, ndị na-ahụ maka ebe a na-echekwa ozu gwara m na ego m bụ pụkụ iri ise na isii.M wee gwa ha na m chọrọ ịhụ ozu nwa m mana nke gbawojuru m anya bụ na mgbe ha buputere ozu ya, anya ya abụọ abụrụla ịhe ewepụrụ”.
Dịka o si kwuo, ha ekweghi ya ka o see ozu nwa ahụ foto.