N’IHI akụkọ banyere ụlọ ọdịda ahụ a na-anụzị oge ọbụla, e meela ka a mara na gọọmenti steeti Anambra ga-amalitezị iwèghara ụlọ ọbụla dara ada na steet ahụ.
Kọmishọna na-ahụ maka ọlụ na steeti ahụ, bụ Maazị Marcel Ifejiọfọr, mere ka a mara nke a oge ya na ndị òtù ọlụ ya gbara gaa n’ebe ahụ nnukwu ụlọ elu nwere òkpukpù atọ dàrà n’Ifite Awka, dị n’okpuru ọchịchị ‘Awka South’.
Ka ọ bịaruru ebe ahụ ya bụ ebelebe nọrọ wee gbuo, Maazị Ejiọfọ kwara arịrị bànyere otu e si anụ akụkọ ụlọ ịda kwa mgbe kwa mgbe n’ebe dị iche iche na steeti ahụ, bụ nke o kwuru na o na-esitekarị n’aka ndị ọlụ ụlọ na-amaghị nke ekwe na-akụ n’iwu ụlọ.
O mere ka a mara na gọọmenti pụrụ isi n’ụzọ dị otu ahụ naghara ụfọdụ ndị mmadụ àlà na ụfọdụ ihe ndị ọzọ, ma kpọkuziekwa ndị na-alụ ụlọ ka ha zèéré ndị adịgbòlója ma hie asaa n’anya tupu ha ahọrọ onye ha ga-enye ọlụ ngö iwuru ha ụlọ. Ọ dụkwara ha ka ha gbaa mbọ hụ na e nyòchàrà ma nabata atụmatụ, aja na akụrụngwá ndị ọzọ ha ji arụ ọrụ, site n’aka ụlọ ‘Material Testing Laboratory Agencies’ dị na steeti ahụ, tupuu ha amàlite itinye ha n’ọlụ, n’ihi na ihe gbassara iwu ụlọ obibi abụghị ihe e ji egwù egwu maka na o metụtara ndụ mmadụ.
N’okwu nke ya, onyeisi otu jikọrọ ndị ọlụ iwu ụlọ n’ala anyị, ngalaba ya nke Awka, bụ Maazị Edmond Nkalụ, kọwara na ọ dị oke mkpà inyocha akụrụngwa dị iche iche e ji alụ ụlọ tupuu amalite itinye ha n’ọlụ iji wee bèlata ajọ ọnọdụ ụlọ ọdịda na steeti ahụ. Ọ kpọkuzịkwara ndị ọlụ ụlọ ka ha kwụsị iji ndụ ụmụ mmadụ eti èpèlé, site n’imezu ihe niile kwesiri ekwesi tupu ha abàgide ọlụ.