ONYE eze odinala nke Umueri n’okpuru ọchịchị Anambra ‘East’ na steetị Anambra bụ Igwe Bennett Chukwuemeka, akwaala arịrị maka nsogbu ide mmiri na-akpa be ya. O kwuru n’otu ụlọ na be ya abụrụla nke ide mmiri tokporo.
Ọ gara n’ihu kwue na ndị Umueri nile bi n’akụkụ mmiri bụkwazi ndị nke ahụ metụtara tinyekwara na mmiri tokpokwara ubi, ụlọ na ọtụtụ ihe ndị dị iche iche.
Onye eze ahụ, n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ, kọwara na ide mmiri tochiri ala ubi karịrị otu narị na iri isii bụ ebe a kọrọ akpụ; mebikwaa ala ubi ebe a kọrọ osikapa.
O kwuru na ya akpọkuola ndị ọ dị n’aka bụ ‘Anambra State Emergency Management Agency (SEMA)’ gbasara ya bụ ike ide mmiri na-akpa mana ka ihe siri gbata kwụrụ, na ya ahụbeghị ha.
Igwe Chukwuemeka gakwara n’ihu kwuo na gọọmentị steetị Anambra ewepụtala ọtụtụ ebe dị iche iche n’okirikiri ahụ bụ ebe ndị ide mmiri chụpụrụ n’ụlọ ga-agbaga ọsọ ndụ, mana dịka ọnọdụ ebe ahụ siri dịrị, ndị mmadụ achọghị ịnọ na ya.
Ọ rịọrọ gọọmentị steetị Anambra ka o mepee ebe ọzọ n’Ama-Umueri, ebe ọtụtụ ndị mmadụ ga-agbata ọsọ ndụ n’ihi na dịka o siri kwu, na ọ chọpụtara na ide mmiri ka ga-achụpụ imirikiti n’ụlọ.
Otu o sila dị, Igwe Chukwuemeka toro Gọvanọ Willie Obiano maka ịgbatara ha ọsọ enyemaka.
Dịka Igwe Chukwuemeka siri kwu, onye isi oche Umueri ‘President General, Umueri General Assembly’, Pius Okonkwo, kwukwara na ide mmiri emebichaala ụlọ ọlụ ebe a na-alụpụta osikapa na akpụ na ọtụtụ ebe ndị ọzọ.
Ha kwuru na ka ihe siri gbata kwụrụ na Gọvanọ Obiano na-eleba ya bụ okwu anya ma kọwakwaa na o kpọtala gọọmentị etiti n’Umueri na obodo ndị ọzọ ebe ide mmiri na-akpa mkpamkpa, ebe osote aka na-achị ala Nigeria bụ Ọkammụta Yemi Osinbajo nọ kwee nkwa na gọọmentị etiti ga-eleba ya bụ nsogbu anya.