OKE iji mmiri nke gbara n’afọ a, ewerela ebe ndị mmadụ bi na ebe a na-akọ ọlụ ubi,mebie akụ na ụba nke a na pụghị ikwu ọnụ ahịa ya . Ndị ihe ndịa kasi njọ bụ ndị ọlụ ugbo na ndị bị nso na akụkụ osimiri Niger na osimiri Benue na Nigeria.
Ihe butere oke iji mmiri nke a bụ na mmiri gafere akụkụ osimiri abụọ ahụ wee kwonye n’ebe ndị mmadụ bi na n’ebe a na-akọ ọlụ, wee mebie akụ na ụba obodo.
Otu mmiri siri wee rie obodo ndị bị n’akụkụ osimiri, ụlọ dị n’ime ha, bụ oke ihe ịtụ n’anya n’ihi na e jisike ahụ ụlọ ụfọdụ anya. Ihe nile nke dị n’ime ụlọ ndị a abugoro ihe mebiri emebi. Ihe nile eji ebi n’ụlọ dịka akwa, ite, oche na nri dị iche dị n’ime ụlọ ahụ emebiela, o wee bụrụ oke ihe ọghọm n’ebe obodo ndị a na ezinaụlọ dị n’ime ha.
Na steeti anyị bụ Anambra, gọọmentị ime obodo o metụtara bụ Ogbaru, Anambra West, Anambra East, Onitsha North, Onitsha South, Ayamelum na Awka North.
Obodo nile nke dị n’ime Anambra West abụgoro ihe mmiri tochiri nke mere na gọọmentị etiti zitere osote onye isi ala Nigeria bụ Osinbajo ka ọ bịa were anya ya hụ nkpankpa oke iji mmiri kpara na obodo ndị a.
N’ izu gara aga, Gọvanọ Willie Obiano jere Ogbaru wee hụ alụ mmiri oke iji kpara n’ebe ahụ. Ụlọ ebe ndị mmadụ bị, akụkụ ụbị ha nile,abụrụla ihe mmiri buru nke bụ na ndị ezinaụlọ ọ metụtara agbagago n’ebe gọọmentị wepụtara ka ndị mmadị biri rue mgbe oke iji miri ahụ tara.
Onye isi ndị otu ‘Rice Farmers Association of Nigeria (RIFAN)’ na Anam bụ Maazị John Okeke kwuru sị na oke iji mmiri ahụ edebego ha bụ otu ọdị ndụ ọnwụ ka mma. N’ala dị karia 400eka ha bụ otu kọrọ osikapa n’afọ 2018, oke iji eburusigo ha nile nke ọnụ ahịa ya kariri narị nde naira na iri ise (N150m).
O kwuru na nke kachasi ha njọ bụ na ego e jiri wee kọọ ọlụ ndị a bụ mbite ka otu ahụ bitere ya na aka ụlọakụ n’ahụ maka ndị ọlụ ugbo (Agric Bank); na akụlụ ngwa ụbị ha ga-eji wee bido ọlụ afọ ọzọ emebisịgo wee debe ha na ubiam nke enweghị olile anya.
Ọtụtụ ndị mmadụ nke anọghị na otu a ma na alụkwa ọlụ ugbo dị iche iche dịka ji, ede, akpụ,na ihe ndị ọzọ ahụghị onye ha kpesaara maka oke ihe ọghọm nke oke iji a buteere ha.
Gọọmentị Anambra steeti si n’aka ụlọ ọlụ ndị ‘State Emergency Management Agency (SEMA)’ nke dị n’Awka na ebuje ihe dị iche iche iji wee kwado enyemaka ha n’ebe ndị oke iji miri chụpụrụ n’ụlọ ha, ma kpọkwa ha ọnụ agụụ nke mere ka ha bụrụ ndị arịrịọ n’obodo ha dị iche iche n’ime Nigeria.
Gọọmentị etiti na nke steetị n’agakwa n’iru na-ama ọkwa sị onye ọbụla bi nso ebe oke iji mmiri a ga-eru ka o were ọsọsọ gaa biri n’ebe ugwu dị. Ọ na-adụkwa ọha na eze ọdụ ka ha kwụsị ịgbochi ezi mmiri si aga ma kpopụ ahịha na’ụzọ ide mmiri.