N’IHI na a sị na ihe emeghị n’izu, o mee n’ọnwa; eze ọdịnala Ọnịtsha, bụ Obi Nnaemeka Alfred Achebe, ewerela oke ọñụ dara ụda wee merùbe mmemme ịgba ọfala ya, àgbà nke iri na asaa ya.
Ya bụ oke mmemme bụ nke weere ọnọdụ na mpaghara Ime Obi na Awka Road dị n’Ọnịtsha, ma bụrụkwa nke a kwàdòrò site n’aka ụlọ ọlụ ‘Globacom Nigeria Limited’ (GLO), bụ ụlọ ọlụ mbụ ala nke Nigeria na-eme ihe gbasaara nzikọrịta ozi ekwentị.
Óké mmemme ahụ dọtara imrikiti ndị mmadụ sitere na mpaghara ebe dị iche iche n’ala Nigeria na mpụga ya, nke gụnyere ndị selitere isi n’ọrụ gọọmenti, ndị eze ọdịnala, ndị nnọchi anya ala Nigeria, ndị ụlọ ọgbakọ omebe iwu, tinyere ndị otu dị iche iche.
N’okwu ya na mmemme ahụ, Igwe Achebe, bụ onye ọñụ juputara óbì, kelere Chineke n’ihi ndụ, ngọzị na ọganihu, nke o jigoro chọọ ya onwe ya na ndị ọ na-achị achị mma, ma kelekwazie òtù dị iche iche bịara isonyere ya na ya bụ oke mmemme, bụ nke ọ kọwara dịka otù n’ime omenala e jiri mara ndị obodo ahụ. Ọ kwara arịrị banyere ajọ ọnọdụ ala Nigeria nọ na ya ugbu a, ihe isi ike dị n’ime ya, na otu ọtụtụ ụmụ mmadụ si atagbú onwe ha n’ahụhụ.
Ọ katọrọ ihe isi ike, ọnọdụ enweghị ọlụ, mpụ na aghụghọ, óhi na ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-ebi ala Nigeria aka ọjọọ, ma kpọkuo ndị nọ n’ọkwa ọchịchị ka ha were uche na egwu Chineke wee chịa ọchịchị ha site n’inwe mmetụ bànyere ọnọdụ ụmụ mmadụ.
Ọ tụụrụ aka na-achị steeti Anambra bụ gọvanọ Willie Obianọ mmamma maka nturu ugo ahụ dara ụda o nwetara na nhọpụta ọkwa ọchịchị ahụ e mere n’afọ gara aga, ma kelekwa ya n’ihi ezi ọchịchị ya, ọlụ mmepe, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị iche iche o mepụtagoro na steeti ahụ na n’ime-ime obodo dịgasị na steeti ahụ.
N’okwu nke ya, Gọvanọ Obianọ, bụ otu nnukwu onye ọbịa pụrụ iche na mmemme ahụ, kelere Igwe Achebe n’ihi mbọ ya n’ichekwaba na igosipụta ịma mma nke ọnatarachi na omenala ndị Igbo, tinyekwuoro mmetụta ya n’ihe gbasaara ọnọdụ akụnụba ala anyị na mbọ dị iche iche ọ na-agba n’ịkwàlìtè ndị ntorobịa ka ha bụrụ ndị kwụụrụ onwe ya.
Ọ kọwara ezi njikere ọchịchị ya dị n’ịkwalite ezi ọchịchị na ezi ọnọdụ akụnụba steeti ahụ site n’ịkwàlite omenala dị iche iche na ihe nlegharị anya ndị ọzọ e jiri mara steeti ahụ, ma gakwazie n’ihu kwe nkwà nkwàdo ya nyegara eze ọdịnala ahụ.
A nọrọ na mmemme ahụ wee gbaa egwu ọdịnala dị iche iche, gosi ọtụtụ ihe ngosi, nye onyinye ma tụkwa mmamma nyegara Igwe Achebe, bụ nke e mere site na ndị òtù dị iche iche bịara isonye na ya bụ nnukwu ihe mmemme.