Ụmụakwụkwọ UNIZIK enyela Nnabuife onyinye nkwanye ùgwù maka ngbasa ozi

0
755
Sir Chuka Unizik Award

Ndị ọchịchị ụmụakwụkwọ mahadum Nnamdi Azikiwe, ‘Students Union Government, Nnamdi Azikiwe University (UNIZIK)’, Awka, wụchara n’ụlọ ọlụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light na Ka Ọ Dị Taa bụ ‘Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC)’,nwanne ụnyahụ, weta onyinye nkwanye ugwu nye onye isi ụlọ ọlụ ahụ (Managing Director), bụ Sir Chuka Nnabuife.

Nkwanye ugwu a, nke a kpọrọ ‘Media Icon Award’, bụ nke ha kpebiri inye ya maka mbọ ya nile n’ọlụ mgbasa ozi.

Ụmụakwụkwọ ahụ kwuru na ha mere nkea n’ihi ncheta afọ iri abụọ na ise nke mahadum ahụ. Onye ndu ma bụrụkwa onye isi ha bụ Ikenna Igwebuike, bụ onye ọchịchị ụmụakwụkwọ nke iri abụọ na ise, kwuru sị na dịka ha mere ncheta ahụ, ha kpebikwara icheta na ịkwanyere ụfọdụ ndị e ji okwu ha agba izu ugwu.

“Otu osisi anaghị emebe ọhịa. Dịka anyị na-akwanyere onye isi ụlọ ọlụ a ugwu, anyị echefughị ndị ọlụ ya maka mbọ ndị ha na-agba.”

Ya mere n’aha ụmụakwụkwọ UNIZIK, ha nyere Sir Chuka onyinye nkwanye ugwu ahụ ‘award’ maka otito nke Chukwu.

Sir Nnabuife, n’akụkụ nke ya, kelere ha: “Daalu nụ! Obi bụ m sọ añụri. Atụbaghị m anya mana ama m na ihe nile na-aga dịka Chukwu siri kwado ya. Ihe ọbụna bụ ebumnobi unu ga-abịa na mmezu “ka Chineke na-enyewanye anyị ike ka anyi ghara ịgharịpụ unu.”

Sir Nnabuife gakwara n’ihu dụọ ụmụakwụkwọ ahụ ọdụ ka ha kpachara anya n’ihe ọbụna ha na-eme. Ọ gwara ha ka ha jide ka ha ji n’ihi na onye a sị ya jide ka oji ọ mara na ihe ọ na-eme dị mma.

GUO:  Nnabuife ebunye ụlọakwụkwọ Ubuluisiuzo ngwa egwu bandị

Ụmụakwụkwọ nile bịara ije a ji añụri kelee ndị ọlụ ANPC nile bụ ndị nke ha kọwara dịka otu ezinaụlọ.

Ha bụ Nwagbo Miracle, Onwudinjo Peace, Anene Chinaza Peace, Tochukwu Godswill, Anikweze Anthony na onye isi ha ‘SUG President’ bụ Igwebuike Ikenna.

Ọ bụ ka ọnwa Junu dị mkpụrụbọchị iri na abụọ n’afọ a bụ 2018 ka a nọrọ na mahadum ahụ mee nnukwu mmemme maka iri afọ abụọ na ise nke ha gbara ebe ha nọrọ tube ndị e ji okwu ha agba izu ugo, ndị gụnyere onye isi ụlọakwụkwọ ahụ bụ Ọkammụta Joseph Ahaneku na ọtụtụ ndị ọzọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here