A KPỌKUOLA ma dụọ ndị nne na nna ka ha gbaa mbọ na-azụlite ụmụ ha n’egwu Chineke ma na-akụnyekwa ezi mkpụrụ n’ime ha màlite oge ha dị na nwata n’ihi ọtụtụ uru dị iche iche nke ahụ na-eweta.
Bishọọpụ enyemaka nke ụka Katọliiki na Dayọsiisi Ọnịtsha, bụ ‘Most Reverend’ Dennis Isizọh, kpọrọ oku a n’ụlọ ụka ‘Saint Mary’s Catholic Church’, Àlọr, dị n’okpuru ọchịchị Idemmili South nke steeti Anambra n’ofufe nrò ịkwọ aka n’isi nke e mere na ya bụ ụlọ ụka.
Ofufe nro ahụ bụ nke a nọrọ na ya wee kwọọ mmadụ ótù narị, iri ise na abụọ aka n’isi, bụ nke e mere site n’aka ya bụ bishọọpụ.
Na nkenke okwuchukwu ya n’ofufe nrò ahụ, Bishọọpụ Isizọh mere ka a mara na nwata a zụlitere n’egwu Chineke adịghị abara naanị onwe ya uru, kama ọ na-abara nne nna ya ma bakwara obodo ya n’ọtụtụ ụzọ dị iche iche.
O kwuru na ụmụaka bụ ọdịnihu nke ala anyị, ma sị na ihe ha ga-abụ n’ọdịnihu ga-adabere n’otu e siri zụlite ha n’ihi na mmadụ adịghị egbute unèrè n’ebe ọ kụrụ ụkpaka.
N’ịrụtụ aka n’ihe gbasaara ekpere, o mere ka a mara na Chineke si n’ekpere akpanyere ụmụ ya ụka, ma kọwakwa ekpere dịka ụzọ pụtara ihe mmadụ nwere ike isi rịọta ihe ọ na-atụ anya ya n’aka Chineke. Ọ kpọkuru onye ọbụla ka ọ dị ike n’ekpere n’ihi na ọ bụ site na ya ka mmadụ ọbụla pụrụ isi wee merie ihe dị iche iche a na-ahụtazị n’ala Nigeria ugbu a.
Ọ rịọkwazịrị ha ka onye ọbụla na-akpọku Chineke ma na-arịọkwa ya mgbaghara oge ọbụla o mehiere, maka na onye mmehie apụghị ịrịọta ihe ọbụla n’aka Chineke.
N’okwu nke ya, ụkọchukwu nke ụlọ ụka ahụ, bụ Ụkọchukwu Martins Ọnụkwuba, kọwara ọbịbịa ahụ bishọọpụ ahụ bịara dịka nke magburu onwe ya, n’ihi na e sitego na ya wee gbapụta ọtụtụ mkpụrụ obi mee ka ha bịaruo Chineke nso.
Ọ dụkwazịrị ndị ahụ a kwọrọ aka n’isi ka ha yiri uwe ezi onye agha nke Chineke ma werekwa ezi omùme hiri isi, iji hụ na ha adaghị mbà maka na nnú tụfuo ụtọ ya, ọ ghọ ahịa.
Mmemme ahụ dọtara ọtụtụ ndị dị iche iche e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ, nke gụnyere minista na-ahụ maka ọlụ n’ala anyị, bụ Dọkịta Chris Nwabụeze Ngige; nwa amadi ahụ na-anọchite ọgbọ nta nkwàdo Anambra etiti n’ụlọ ọgbakọ sineeti ala anyị, bụ Chiifu Victor Umeh.